Ortom: Ihe m jiri kpụpụ Miyetti Allah ụlọikpe

Samuel Ortom Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Samuel Ortom: Otu Miyetti Allah bụ ndịkpatara oke ogbugbu mmadụ na Benue

Gọvanọ na-achị Benue steeti bụ Samuel Ortom ekwuola na ihe o jiri gbaa ndị otu ọchịehi bụ Miyetti Allah akwụkwọ bụ iji nweta ikpe nkwụmọto n'okwu gbasara mwakpo ndị ọchịehi merela na steeti ahụ.

Benue steeti gbara otu Miyetti Allah akwụkwọ n'ụlọikpe nke ga-ebido n' ụbọchị Tọọsde, n'ụlọikpe ugwu dị na Markudi.

Ortom kwuru na agbagnyeghị mkpu ọchịchị ya na-eti n'ihe gbasara mkpamkpa na akpa na steeti ahụ, o nwebeghị ihe gọọmentị mere maka nsogbu gbasara ogbugbu mmadụ ndị ọchiehi merela na steeti ahụ.

" Ihe anyị kpebiri ime n'ihi na o nwebeghị ihe gọọmenti mere bụ ịgba otu ahụ akwụkwọ n'ụlọ ikpe.

" A gwala m n'ikpe ahụ ga-amalite na ụlọikpe ukwu dị na Makurdi.

"Anyị ga-eji mmadụ iri asaa na atọ mwakpo mere ụbọchị Afọ Ọhụrụ bido. Ekwenyere m na ụlọikpe ga-enye anyị ikpe nkwụmọọtọ."

N'akụkọ nke ụlọọrụ akụkọ Sun depụtara, Ortom kwuru na " Ihe gbarasara Miyetti Allah anaghị enye m ọnụ okwu.. Ekwuola m ya ugboro ugboro. I dela m ya, Aga m aga n'ihu na ide ya ma na-eti mkpu maka ndị ndu Miyetti Allah bụ ndị nyụrụ ihe na-esi dịka ọ siri gbasaa oke ogbugbu mmadụ na Benue steeti.

"E nwere ihe mgbaama; ndị dị na igwe mmitaokwu(tapes); ha kpọrọ ọgbakọ ndị ntaakụkọ ebe o nweghị otu onye n'ime ha gọrọ na ihe a sị na ha kwụrụ n'akwụkwọ akụkọ abụghị ihe ha kwuru.

"Ha kwuru na ọ bụ maka Jihadị; ọ bụghị maka ehi ịkpa nri. Ha sị na ọ bụ ịbia were ọnọdụ, ịbia weghara ala. Ekpesarala m ndị ọrụ nchekwa. Enwekwara m olileanya na ha na-elebanye ya bụ okwu anya.

"Mgbe oge ruru, a ga-anwụchi ndị a niile n'ihi na o nweghị onye ga-ala n'efu."

Akụkọ ga-amasị gị: