Okorocha: 'Nsogbu APC n'Imo si n'aka ndị isi etiti'

Okorocha na Oyegun Image copyright Getty/APC.com.ng
Nkenke aha onyonyo Ndị ndụ APC na-agwa Okorocha ya siri ụzọ ziri ezi kwuo uche ya

Okorocha bụ kwa onyeisi otu gọvanọ ndị nọ n'okpuru APC atụọla Oyegun aka na ọ na-akpa nkata iji me ka APC ma afọ n'ala n'Imo steeti.

O kwuru nke a maka ihe mere na ntuliaka imeụlọ nke APC n'Imo ebe e chere na ụfọdụ ndị otu APC zuru ihe ndị ekwesiri iji mee ntuliaka ahụ.

Onye na-ekwuchite ọnụ ya bụ Sam Onwuemeodo kelere ndị uweojii maka ọrụ ha ijide ndị mere nke a

O dere, "anyị ma ndị aka ha dị na ohi ngwa ntuliaka imeụlọ nke gara ga-apụta ihe n'oge adịghị anya".

Sịnetọ Hope Uzodinma nke ọdịda anyanwụ Imo kwuru na ya ekwenyeghi n'akụkọ ndị uweojii na-ekwu na ha nwuchiri ndị ji ngwa ntuliaka ahụ

Ọ kpọkwara Oyegun oku ya dọọ Rochas aka na ntị maka ebubo ya na-ebute mkpasa n'etiti APC na ihe mmebọ n'iru ọha niile.

Image copyright @officialAPCng

Gini butere okwu a:

  • Ntuliaka imeụlọ nke APC emere n'Imo ghọrọ ọgbaaghara maka ebubo izuru ngwa ntuliaka ahụ eboro ụfọdụ ndị ọrụ APC.
  • Ndị uweojii nwụchịrị ụfọdụ mmadụ ndị mere ihe, n'ime otu onye atụrụ aka na-arụrụ Sịnetọ Uzodinma ọrụ.
  • Uzodinma agọrọ na onye ahụ e jidere abụghị onye ọrụ ya ma bo Okorocha ebubo emeghi ihe site n'ụzọ zuru oke.

N'otu ọnụ kwa, ndị Okorocha boro ebubo bụ National Working Committee, NWC n'aha ịchafụ ekwuola na Rochas emetaghị APC mma.

Na nzaghachị, onye odeeakwụkwọ otu APC bụ Bolaji Abdullahi gwara Gọvanọ Okorocha na ọ bụrụ na o nweghi ike ịhazi mmekọrịta dị n'etiti ya na ndị nke ya, ya ebokwasila ndị ndu APC nsogbu nke a wetara ya.

N'ọnụ ya, "Gọvanọ Rochas nwee okwu ọbụla ya jiri ụzọ ziri ezi kwuputa ya kama ibogharị ndị mmadụ ebubo"

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a