Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ndị Bishọp Katọlik ehiwela ngagharịiwe
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a
Ndị Bishọp ụka Katọlik ehiwela ngagharịiwe

Ebe foto si, @NGRPresident
Ndị Bishọp ụka katọlịk na Naịjirịa ehiwela ngagharị iwe n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee maka ndị ụka ha gụnyere ndị ọzụzụ atụrụ abụọ egwuru na Benue Steeti n'ọnwa gara aga
Ngagharị iwe a ga-eme n'ụbọchị ahụ aga-eli ndị a nwụrụ anwụ ma kpọkuo ndị ụka Kraịst niile ga ha gbakọta aka ọnụ mee ya bụ ngagharị iwe.
Gọvanọ Rochas Okorocha na ndị ndu APC na-alụ ọgụ

Ebe foto si, Getty/APC.com.ng
Ọgbaghara ka na-aga n'ihu na pati APC nke Imo Steeti dịka Gọvanọ Rochas Okorocha ebola ndị ndụ APC bụ National Working Committee ebubo na aka ha dị na ya.
Na nzaghachi, onye odeeakwụkwọ APC bụ Bolaji Abdullahi gwara Gọvanọ Okorocha na ọ bụ enweghi ike ịhazi mmekọrịta dị n'etiti ya na ndị nke ya bu nsogbu ya, ya ebokwasila ndị ndu APC ihe o wetara onwe ya
Akụkọ ndị na-amasị gị:
World Health Organisation (WHO)

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-ahụ maka ahụike n'ụwa bụ World health Organisation ekwuola na ha na-atụ anya ibubata ọgwụ nyọcha maka ọgwụgwụ ọrịa ebola na mba Congo na mbido izuụka a.
Ha kwuru na ruru ọnụ ọgwụ puku anọ bụ ihe a ga-eziga n'ebe ahụ.
N'egwurewgu

Ebe foto si, Rangers international FC
Barcelona amala afọ n'ala na ebumnobi ha ịbụ ndị anaghị emeri emeri n'asọmpị La liga nke afọ a.
Ebe Neymar turula ugo dịka ọkacha agba bọọlụ na France Lig Une
Rangers na Akwa United enwetaghị goolu ọbụla dịka ha zutere onwe ha n'asọmpi NPFL nke izuụka Iri abụọ na otu.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
Ipob asaala Okorocha