Uwazuruike: Ejighị otu obi bido APC

APC Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC mere ntuliaka imeụlọ n'izu ụka gara aga

Ndị ọnụ na-eru n'okwu amanyela ọnụ n'okwu gbasara ntuliaka imeụlọ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress( APC) mere n'oge gara aga.

Onye bụbu Aka Ikenga aha ya bụ Goddy Uwazuruike kwuru ya bụ ntuliaka gosiri na ejighị otu obi were bido APC.

O kwuru na mgbe ndị otu Bola Tinubu nakwa onyeisiala biakọtara ọnụ ihibe APC, ihe kachasị ha mkpa bụ otu ha ga-esi nara ndị nọ na ọchịchị mgbe ahụ ike ichi obodo.

Gere ihe o kwuru n'uju ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionUwazuruike: Ejighị otu obi bido APC

Onye na-arubu n'ụlọ omeiwu nke nta bụ Chukwuma Umeoji kwuru na etu esi mee ya bụ ntuliaka imeụlọ APC gosiri na nsogbu ga-adị na ntuliaka na-abia na 2019.

Umeoji kwuru na ọgbaghara dara ebe dịka Imo,Ebonyi,Enugu,Abia,Ekiti,Lagos na Porthartcourt gosiri na-enweghị ikike onye kwuo uche ya nke imeụlọ na APC.

Mana onye otu APC dị n'En ugu bụ Ebubeagu okafor kwuru na emere ya bụ ntuliaka imeụlọ nkeọma.

O kwuru na ọdịghị mmiri ọbụla gbaruru makana o gosiri na ọchịchị onyekwuo ụche ya bụ ọnatara nkeoma na APC.

N'ọnụ ya''otu ndọrọndọrọ ọchịchị kwesiri ka ha were aka ha mụta ka ha ga-esi mee ka ọchịchị onye kwuo uche ya mie emie n'ime onwe ha''

O kwukwara na ọgbaghara dara n'ụfọdụ akụkụ ebe e mere ya bụ ntuliaka imeụlọ bụ maka oke ọchịchọ ndị mmadụ.

Lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ kwuru na soshal midia twita maka ntuliaka imeụlọ APC :

Akụkọ ndị ga-amasị gị: