Nwoke na nwaanyị enwere ike ịbụ enyi na-enweghi ihe jikọrọ ha?

Nwoke na nwaanyị bụ enyi Image copyright Getty Images

Kemgbe ụwa bidoro, 'ime enyi' dị n'etiti nwoke na nwaanyị na-enweghị ihe ọzọ ga-ejikọ ha, bụ okwu akpụ n'ọnụ kwa mgbe kwa mgbe.

Ndị Igbo na-asị na "a na-edewe ewu n'ọba ji sị ya atala ya?" Ya kpatara eji nwee ụzọ dị iche iche a na-esi eso enyi dị n'etiti nwoke na nwaanyị.

Oge ụfọdụ, ị ga-ahụ ndị na-ajụ ajụjụ sị 'nwoke na nwaanyị ọ na-abụ enyi?'

Ụfọdụ ga-aza gị sị na nwoke ọbụla ya na nwaanyị bụ ezigbo enyi, nwere ihe ọzọ jikọrọ ha, ha na-achọghị ikwuputa.

Ndị ọzọ ga-asị gị na enweghi ihe ọjọọ dị na ya, na ha nwere ike ịbụ enyi dị ka nwanne.

Mana nwoke na nwaanyị enwere ike ịbụ 'sọsọ' enyi?

N'ajụjụ ajụrụ n'igwe okwu ọhụrụ Facebook sị "nwoke na nwaanyị onwere ike ịbụ enyi na-enweghị ihe ọzọ jikọrọ ha?" otu onye zara

"Anam anụzị akụkọ ugbu a na ọ rara ahụ nwoke na nwaanyị bụ nwanne ịbụ enyi na-enweghị ihe dị n'etiti ha abụọ ugbu a, ka ọ fọzie mmadụ abụọ na-enweghi ihe jikọrọ ha"

Onye ọzọ a kpọrọ Michael, kwuru sị "ọ ga-ara ahụ maka na ọ bụrụ ezigbo enyi gị, enwere ụdịrị nkata unu ga-akpagide (ọdịrị nkata na-agaghị eme gị ihere ịkpa n'etiti ezigbo enyi gị nwoke ma ọ bụ nwaanyị) rute ebe obi agaghị ekwe eru gị ala gbasara onye ahụ kwesịrị ịbụ enyi gị."

Stanley Ezeh kwuru sị "anaghị eji ji ọhụrụ anwa ewu ọnwụnwa. Nwunye m ga-alụ anwakwala anwa chee ụdịrị echiche a, ọ ga-ebu akpa ya laghachị n'ụlọ nna ya."

Nwaanyị na nwoke nwere ike ịbụ ezigbo enyi

Ụfọdụ ndị kwere na nwoke na nwaanyị nwere ike ịbụ enyi na-enweghi ihe ọjọọ onye ọbụla n'ime ha bu n'obi.

Iheanacho Chigbu kwuru sị "Enwere m nwaanyị mụ na ya bụ ezigbo enyi kemgbe afọ asaa! Ike ịjikọta onwe gị dị mkpa, mana gbasara m, onweghi ihe gbasara m n'ịjikọta onwe m maka na onweghị ihe ọjọọ anyị abụọ bu n'obi.

Johnson kwuru sị "ọ bụ ihe nwere ike ime, mana ọ na-ara ezigbo ahụ ijide onwe gị"

Nathaniel Wilcox Thompson kwuru sị: "nwoke na nwaanyị nwere ike ịbụ enyi na-enweghi Ihe jikọrọ ha dị mmekọahụ n'eziokwu. Ọ dịkwa Ka mụ onwe m na-arụ ọrụ na gọọmentị, enwere ọtụtụ ndị inyom mụ na ha dị na mma nke ukwuu mana enwebeghị mgbe anyị nwekọara mmekọ."

Ndị otu ihe ma ọ bụ abụọ kwụsịrị ha

Ụfọdụ kwuru na ị nwere ike ịchọ ka ihe ọzọ jikọọ gị na ezigbo enyi gị, mana ị cheta na ihe nwere ike imebi ma ọ bụ na gị na onye ahụ nwere ike kwụsị inwe mmekọ n'ụzọ ọbụla, ị kwanyere onwe gị ugwu ma tụgharịa uche gị.

Uchenna Ezihe kwuru sị "Enwere m ọtụtụ enyi nwaanyị na-enweghị ihe jikọrọ anyị, mana ama m na ọ bụ nanị ọbere akara na-ekewa ('ezigbo enyi', 'enyi ihe ọzọ jikọrọ gị na ya', na 'mmekọrịta nwoke na nwaanyị'). A na m enye onwe m ezigbo ohere, maka achọghị m imebi enyi dị n'etiti mụ na ha."

Emedolibe Ngozi Emeka kwuru sị "Ụfọdụ oge, ewu na-akwanyere onwe ya ugwu ma ọ nọrọ n'ọba"

Kedụ ihe dị mkpa n'ime enyi?

Ụfọdụ na-abanye n'ime enyi maka na ha chọrọ onye ga na-eche echiche dịka ha, ụfọdụ chọrọ onye ga na-agwa ha eziokwu, etu onye ya na ha nwere mmekọrịta nwoke na nwaanyị agaghị esi agwa ha.

Ndị ọzọ chọrọ onye ga na-agba ha ume etu pụrụ iche.

N'agbanyeghi ụdịrị enyi dị n'etiti nwoke na nwaanyị, ọ na-adị mkpa ịmata ma unu abụọ akwụkwa n'otu akụkụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKedụ ndị ga-erite akụ nwoke ma ọ nwụọ?

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a