Ejighi ọnụ agwa Ndị Igbo na ụzọ dị mma - Ohuabunwa gwara Igbokwe

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMao Ohuabunwa kwuru maka Joe Igbokwe

Mao Ohuabunwa bu omeiwu ukwu na-anochịte anya ndị Abịa Nọt n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa na BBC Igbo nwere mkparịtaụka na be ya n'Abuja maka ihe metụtara ndị Igbo, ọkachasị ebe ọ metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị na ha bụ ndị ji ya mere aka ọrụ.

Na mbụ, anyị jụrụ Ohuabunwa maka ihe ndị mmadụ na-ekwu na ndị nọ na ndọrọndọrọ bụ ndị anya adịghị eru n'ala etu o kwesịrị.

Ohuabunwa sị na nke a abụghị eziokwu ọkachasi ebe ọ metụtara ya.

O kwuru na o bidoro ndọrọndọrọ mgbe ndịagha chiliri aka elu were nye ndị nkịtị ọchịchị n'afọ 1999. Mgbe ahụ, o kwuru, ndị ndọrọndọrọ ebidobeghị inwe ihe ndị Bekee na-akpọ "godfather".

O kwukwara na ndị ndọrọndọrọ si ala Igbo gbara mbọ ọfụma ịhụ na oke ruru ala Igbo lọtara.

Mana okwu ya, bụ nke gosiri na Ndị Igbo metere ndọrọndọrọ ọfụma mgbe ahụ, mere ka anyị jụọ ya maka ihe Joe Igbokwe, bụ ọnu na-ekwuchitere ndị All Progressives Congress (APC) bụ pati nọ n'ọchịchị na Legọsị steeti, kwuru banyere etu Igbo si eme ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ sara anyị sị na Igbokwe kwesịrị iweta ihe ọma ọ hụrụ na nkata nke ọ nọ (bụ APC) nye Ndị Igbo.

Okwu ya nke a dị n'elu.

Anyị jụrụ Ohuabunwa maka ihe onye otu ya bụ Dino Melaye na-agabiga site n'oku ndị uweojii kpọrọ ya, ọ gwara anyị na ihe a na-eme abụghi ihe kwesịrị maka ọ mere mba ndị ọzọ ewere ya na-achị ndị Naịjirịa ọchị.

Ọ sị na ọ bụ obodo ka a na-akparị na ọbụghị Dino.

Lee ihe o kwuru ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMkparita uka BBC Igbo Omwiewu Ukwu Mao Ohuabunwa

N'ihe banyere ihe ụfọdụ mmadụ ji na-akatọ ya maka nkwalite o mere, ọ gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị anya ụfụ na-eme ihe a, maka ihe o mere bụ inyere ndị mmadụ aka ịhụ na ha nwetara ihe ha ga-eji nyere onwe ha aka.

Gee ya nti:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionSinetọ Mao Ohuabunwa kọwapụtara ihe kpatara o jiri nye ndị ọ na-anọchite ite eji eghe ihe

Na ngwụcha, Omeiwu Ohuabunwa gwakwara BBC Igbo na ha bụ ndị na-anọchịte anya ndi Igbo n'ụlọomeiwu na-agba mgbọ ịhụ na ahaziri ọnọdụ Igbo na Naịjirịa, mana ọ siri na ọ ga-abụ n'usoro ndị Bekee kpọrọ "restructuring" ka a ga-eji mee ya bụ nhazigharị.

Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a