A kpọpụrụ Zakzaky ụlọikpe na Kaduna

Zakzaky Image copyright PR Nigeria
Nkenke aha onyonyo Zakzaky mgbe a kpọtara ya n'ụlọikpe

E highariala ikpe onyeisi ndị Shi'a na Naịjirịa bụ Ibrahim el-Zakzaky n'ọnwa Juun 21.

A kpụpụtara el-Zakzaky na nwunye ya n'ụlọikpe dị na Kaduna n' ụbọchị Tuuzde.

Ndị kpọrọ Zakzaky gawa ụlọikpe bụ gọọmenti Kaduna bu ndị na ebo ya ebubo na o gbụrụ onye agha Naịjirịa mgbe ndị na eso ya na ndịgha nwere nsogbu n'afọ 2015.

Mmadụ abụọ ọzọ eji aka bụ Yakoub Yahaya Katsina na Sanụsi Abdulkadar Koki apụtaghị n'ụlọikpe ta.

N'ụlọikpe, agụọrọ Zakzaky ebubo a na-ebo ya, mana o kwuru na aka ya adịghi na ya.

Maxwell Kenyon, bụ onye ọkaiwu Zakzaky, si ka ulọikpe nye ohere igbapụta ya na mkporo, mana ọkaikpe ekweghị.

Ọkaikpe Kurada si ka Kenyon de ihe ọchọrọ ede.

Onye nọchịtere anya ndị gọọmentị Kaduna sị ka ụlọikpe kwere ka DSS ka jide Zakzaky.

Ọlụikpe kwenyere na nke a, sị ka akpọghachie Zakzaky Abuja.

Ụlọikpe gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ n'ụbọchị 21 nke ọnwa Juun ka ha ga etinye ọnu ọzọ n'ikpe a.

Mana, ndị Shi'a si na ha ekweghị n'ije a mere.

N'akwụkwọ ha dere, Abdulhamid Bello, bu otu n'ime ndi isi ha, kwuru na ha ga aga n'ihu na-eme ngaghari iwe ha.

"Ọ bu gọọmentị etiti ka anyị ga ata ụta ma ya bụrụ na onwere ihe mere Zakzaky," Bello kwuru.

Isiokwu Ndị Emetụtara