Osibanjo: Gọọmenti ga-etinye N10bn na idozi steeti ọchiehi mebiri

Ọkammụta Yemi Osibanjo Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Osote onyeisiala Yemi Osibanjo,onye ụkọchụkwụ ụka 'Redeem' bụ Ọkammụta iwu

Osote onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osibanjo kwupụtara na gọọmenti etiti etinyela aka na akwụkwọ maka mmapụta ijeri naira 10.

O kwuru na a ga-eji ego a ịrụgharị ma wugharịa obodo ndị nsogbu Fulani na-achiehi na ndịọrụ ugbo metutụtara na Benue steeti na a steeti ndị ọzọ.

Osibanjo kwuru nke a n'ụbọchị Tuusde oge ọ gara nleta na ebe ndị gbara ọsọ mndụ nọ na Abagana na daudu dị na okpuru ọchịchị Makurdi na Guma dị na Benue Steeti.

O kwuru na ọnọdụ ndị gbara ọsọ ndụ n'ihi ọgbara ahụ na-echu onyeisiala Muhammadụ Buhari ụra.

"O nwere ihe ndị a chọpụtarala; nke mbụ bụ nchekwa. Anyị chọrọ ịgba mbọ ịhụ na ebe ndị e mebiri na e chekwara ya.

"Nke abụọ bụ bụ ịgba mbọ hụ na ndị gbara ọsọ ndụ laghachiri na be ha, alụgharịala .

"Nke atọ na ndị ọrụugbo laghachiri na ugbo ha nakwa na enyere ma ndị abụghị ndị ọrụ ugbo aka ibido ndụ ọzọ."

Ọ gara n'ihu kwa ha na a mapụtala ego a ga-eji belata ahụhụ ha na-ata sị, "A bịara m ịgwa ụnụ na gọọmenti ala Naijiria nwere ike ichekwa ụnụ ma gbooo mkpa ụnụ, na anyị na ezipụkwu ndị ọrụ nchekwa ka ha chekwaa ụnụ."

N'okwu ya ya, Gọvanọ Benure bụ Samuel Ortom rịọrọ ka gọọment tinyekwuo uchu na nchekwa mpaghara ahụ

" Ọ masị ndị ogbuọbara a si Libya, Boko Haram maọbụ ndị na-achị ehi, sị tinyekwuo nchekwa iji kpochapụ ha na steeti a ka ndị mmadụ nwee ike ịlaghachi na be ha."

Odeeakwụkwọ ngalaba na-ahụ maka gbatagbata na steeti ahụ nke a kpọrọ State Emergency Management Agency (SEMA), bụ Emmanuel Shior, kọwara na ebe ndị gbara ọsọndụ nọ n'Abagana nwere mmadụ ipuku iri atọ na ano, narị itoolu ,iri atọ na isii(34,936) si Benue na Nasarawa steeeti gbaa ọsọ ndụ oge e mepere ya na ọnwa Februwarị mana ugbua e nwere mmadụ puku iri na abụọ, iri anọ na otu (12,041) ebe ahụ.

O kwukwara na achịkọta ọnụọgụgụ ndị nọ na ebe mgbata ọsọ ndụ asatọ dị na steeti ahụ, bụ mmadụ otu narị, iri asaa na ise, iri na asaa (175,017.)

Akụkọ ga-amasị gị: