Ụlọikpe akagbuola nkwụsịọrụnike Omo-Agege

Sinetọ Ovie Omo-Agege Image copyright Sen Ovie/ Twitter
Nkenke aha onyonyo Ndị sinetị kwụsịrị ya ọrụ ụbọchị iri itoolu

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ajula ịkagbu nkagbu o mere banyere nkwụsịọrụnike nke ụlọomeiwu ukwu mere Sineto Omo-Agege.

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ajụla ịkagbu nkagbu o mere nkwụsịọrụnike nke ụlọimuwu mere Sineto Omo-Agege.

Omo-Agege kwubụrụ na ọ ga-ebido ọrụ ya n'ụlọomeiwu ụbọchị Tuusde mana anya ahụghị ya.

Omechara ga orụ taa, mana ọnọteghi aka tupu ọ pụọ.

N'otu aka ahụ, ndị ụlọomeiwu Sineti kwuburu na ha agaghị enye ya ohere ma meecha kwuo na ha egbochighị ya ibido ọrụ ọzọ.

Cheta na ndị ụlọomeiwu ukwu kwụsịrị Omo-Agege ọrụ n'ike n'ihi na ọ na-akwụnyere Buhari na nhazigharị atụmatụ etu ntuliaka 2019 ga-esi ga mana ọ gbara ha akwụkwọ n'ụlọikpe ma merie.

Ndị Sinetọ kwuburu na ha agaghị ekwe ka o bido oru mana ha mechara kwugharịa.

Nhazi atụmatụ ntuliaka 2019 nke ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec n'aha ịchafụ wepụtara buwere ntuliaka ọkwa onyeisiala ụzọ mana ụlọomeiwu ukwu tụgharịrị ya.

Onyeisiala Muhammadu Buhari jụkwara itinye aka na iwu ahụ oge Sineti mechara nke a.

Akụkọ ga-amasị gị: