Sịneti: Uru dị n'iwu azụmaahịa ọhụrụ ehiwere

Ọfọ ndị sineti Image copyright Nigeria Senate/Twitter
Nkenke aha onyonyo Ọfọ ndị sineti bụ ihe na-egosi ikike ndị sineti

Na nzụkọ ndị Sineti mere ụnyaahụ bụ ebe ha hiwere iwu ọhụrụ akpọrọ Company and Allied Matters Act n'olu Bekee mgbe agụpụtara ya nke ugbo atọ.

Onyeisi ndị Sịneti bụ Bukola Saraki kelere ndị Sịnetọ maka nke a, kwuo na ọ bụ oke ihe ha mere na njem ha ime iwu n'ala Naịjirịa.

"Anyị ehiwela usoro iwu dị mkpa iji kwalite azụmaahịa na ibelata oke ihe mgbochi dị n'azụmaahịa na Naịjirịa.

Nke a bụ iji kwuo n'ezie na anyị dị njikere ịzụahịa na Naịjirịa, i nyere ndị azụmaahịa nta aka, nakwa ịrụpụta ihe ọhụrụ ma kwalite azụmaahịa." Saraki kwuru.

Ụfọdụ uru dị n'ihiwe iwu a gụnyere:

  • Ọ ga-eme ka azụmaahịa na Naịjirịa maa nke ndị mba ọzọ aka.
  • Otu mmadụ nwereike imepe ụlọọrụ ma mee ihe ndị dị n'ime mana oge mbụ ọ bụ mmadụ abụọ nwereike ime nke a.
  • Ọ na-akwalite iji technụzụ n'idebanye aha ụlọọrụ.
  • Ọ na-ekpochapụ iwu azụmaahịa ndị nabaghị uru iji hiwe ụlọọrụ ntaa.
  • Ọ na-ebalata ego eji emepe ụlọọrụ na Naịjirịa.
  • Ọ na-enye ohere idenbanye aha ụlọọrụ n'ebe ọbụla n'ụwa site n'ịntanet nke iwu kwadoro.

BBC Igbo gbara otu onye azụmaahịa bụ Ike Chidiebere ajụjụ.

O kwuru na iwu a dị mma mana gọomentị kwesiri ịkọwara ndị azụmaahịa na-agụghị akwụkwọ ihe nke a pụtara.

Chidiebere kwuru na ndị ụlọọrụ National Orientation Agency kwesiri ị bata n'ime ahịa nakwa obodo kọwaa uru dị n'iwu ọhụrụ a.

Na nke a ga-eme ka ndị mmadụ tinye uchu n'ime azụmaahịa n'ala Naịjirịa.

Gere ihe o kwuru ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionSịneti: Uru dị n'iwu azụmaahịa ọhụrụ