Akụkọ kachasị taa: Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka ehiwela ngalaba ọhụrụ
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a:
Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka ehiwela ngalaba ọhụrụ
Ebe foto si, Getty Images
Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka ehiwela ngalaba agụmakwụkwọ na-ahụ maka ezi akparam agwa na ugwu ruru onye.
Onye ndebanye aha nke mahadum ahụ bụ Chris Igbokwe kwupụtara nke a taa.
Ụlọ ome iwu etinyela aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2018
Ebe foto si, Getty Images
Buhariwepụtara ndị ụlọoimiwu Bojet afọ 2018 ọnwa isi gara aga.
N'ikpeazụ ndị omeiwu ala Naịjirịa etinyela aka n'akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2018 n'ọnụ ego ruru tarịị itoolu.
Egọ a ji pecenti iri karịa ọnụ ego mkpata na mmefu onyeisiala Buhari zigara ha n'ọnwa isii gara aga.
Akụkọ ofesi
Ebe foto si, AFP
Gọọmentị Amerịka ekwuola na ha ka-adị njikere ha na ndị Nọt Korịa inwe mkparịta ụka taraọchịchị ma ọ bụrụ na ha chọọ
Agbanyeghi egwu onye ndụ Nọt Korịa bụ Kim jong-un na-eyi na ọ ga-achabi mkparịta ụka ahụ.
N'Egwuregwu,
Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu Olympic Marseille nke mba Fransị ga-ezute Athletico Madrid nke mba Spen ma ụfọdụ nkeji iri na isi ka ọkụọ elekere asatọ nke abalịa.
Nke a bụ iji mara onye ga-amabute iko Uefa Europa nke afọ 2018.
Gee ya nkeji nke abalị a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe onyonyo nke taa:
Maazị Usman Chinedu Mbaekwe gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ.