Ndị Medview akwụwala ndị njem n'ọdọ ụgbọelu Abuja

Ndị na-eche ị banye ụgbọelu Medview na ọdọ ụgbọelu Abuja

Ndị chọrọ iso Ulọọru Medview site Abụja gawa Legọsị tọrọ na ọdọ ụgbọelu nke Nnamdi Azikiwe n'Abuja kamgbe ụnyaahụ.

Ndị ahụ gbatara akwụkwọ njem ruru ọdọ ụgbọelu we chọpụta na Medview enweghị ụgbọelu na-aga ebe ọbụla.

Emechara gwa ha na a ga-etinye ha n'ụgbọelu Dana mana emeghi otu a n'ikpeazụ, agbanyeghị na ndi mmadu chere ruo elekere iri nke abalị.

Ndị Medview mechara sị ka ndị mmadụ lagachịte taa maka ị bido njem ha.

Ka ha ruru ọdọ ụgbọelu n'ụtụtụ a, ọkwa otu akụkọ a ka ha nụrụ, ka ndị ọrụ Medview kwukwara na ga ga-etinye ndị mmadu na ụgbọelu Arik, bụ nke ga-amalịte njem na elekere isii nke abalị tata.

Ọtụtụ n'ime ndị a tọrọ n'Abụja gwara BBC na ihe ndị ọrụ Medview gwara ha bụ na-onweghi ụgbọelu obula ga-aga ebe ọbụla.

Ndị n'ime ndị nkem a chọrọ ka enyechia ha ego ha kwụrụ gwara BBC na ndi Medview kwuru na ha adịghị enyechi ego.

Ọtụtọ a ndị a tọrọ n'Abụja bụ ihe iwe nye ọtụtụ n'ime ha, ọkachasị ndị ihe na emebịnaghị maọbu ndị na-aga ọrụ.

Otu nwoke BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ọ bụ ọrụ ka ya na-aga na mba Ghana. Okwuru na ọ ya ruo Legọsị, ọ banye ụgbọelu ga-eburu ya gawa Ghana.

Ihe onye njem gwara anyị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe onye njem Medview gwara BBC Igbo

Otu onye so na ndị njem a gwara BBC na ihe kachasị iwe ya iwe bụ a onweghi ihe ọbụla ndị Medview chọrọ ime maka ụfọdụ n'ime ha enweghi ebe ha ga-edobe isi n'Abuja.

Iwu ji njem ụgbọelu kwuru na ekwesiri inye ndị tọrọ n'ọdọ ụgbọelu ebe ha ga-alalụ ma ya bụrụ na ụgbọelu efepụghị.

BBC Igbo gbara mbo ị nweta isi ụlọrụ Medview ịnụta ọnụ ha maka ihe na-eme mana onweghi onye zara.

Ihe iwu kwuru maka ụdịrị ihe a

Image copyright Ncaa.gov.ng

Iwu nyere ihe ndị ụlọọrụ ụgbọelu ọbula kwesiri ime ma ọ bụrụ na ha enweghi ike i mee njem

  • N'ime nkeji iri atọ: kọwara ndị njem ihe mere njem ha jiri kwụsị
  • N'ihe karịrị elekere abụọ: nye ndị njem nrị
  • N'ihe karịrị elekere atọ, kwụghachi ndị njem ụgwọ ha kwụrụ
  • Ọge gafee elekere iri bke abali: chọrọ ndị njem ebe ha ga-alarụ ụra abali.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a