Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a : Ndị mmadụ rahụrụ n'ezi taa amaka Markle
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Taa bụ ụbọchị a karaaka n'isi Prince Harry na Meghan Markle
Ebe foto si, Getty Images
Meghan Markle gbara afọ 36 ebe dị ya gbara afọ 33
Nwa nwa Queen Elizabeth bụ Prince Harry na Meghan Markle chọrọ Igba akwụkwọ n'ụlọụka St. George na Windsor tata.
Fashola sị n'inyi juru na be anyị
Ebe foto si, Getty Images
Babatunde Fashola bụ minista na ahụ maka ọrụ, ọkụ na ụlọ
Minista na-ahụ maka ọrụ, ọkụ na ụlọ bụ Babatunde Fashola adọọla ndị mmadụ aka na ntị maka etu ha si na-awụfụ ahịhịa n'ọkporoụzọ.
Fashola Kwuru nke a ka ọ gara nyochaa ọrụ gọọmentị na-arụ n'Abia steetị, bụ ebe o kwuru na nwufu ahịhịa n'okporoụzọ bụ ihe juru ya anya site Okigwe ruo Lokpanta.
Ugboelu kuriri na Cuba
Ebe foto si, Getty Images
Nnyocha ka na-aga n'ihu maka ụgbọelu a kuriri
Ndị nyocha naha etinye anya n'ihe kpatara ụgbọelu jiri kurie ụnyaahụ n'akụkụ isi obodo Cuba bụ Havana.
Isi mmadụ dị otu narị na isii (106) lara ebe mmadụ atụ pụtara na ya bụ ihe mberede.
Miyatti Allah dọrọ Gọvanọ Ortom aka na ntị
Ebe foto si, Getty Images
Nnyocha ka na-aga n'ihu maka ụgbọelu a kuriri
Ndị na-anọchite anya ndị Fulani na-achị ehi na Naịjirịa bụ Miyetti Allah, akpọọla onyeisiala Muhammadu Buhari oku ka ọ dọọ aka na-achị Benue steeti bụ Samuel Ortom aka na ntị.
Ortom hibere iwu imachi ndị ọchịehi ịchịgharị ehi ha na gburugburu steeti ahụ. Ndị Miyetti kwuru na ha ga-eme ihe niile n'usoro iwu ịhụ na egbochighi ha ibi ndụ etu ha si ebi.
Gee nkeji nke abalị a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe onyonyo nke taa:
Ara m bụ oke ibu arụ nye m