Ogbaaghara na APC Imo steeti
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Ogbaaghara dara na APC Imo steeti, kedụ isi ya?

Unyahu BBC na Ebere Nzewuji bụ ojeozi Gọvanọ Okorocha na ịhe gbasara soshal midia kparịtara ụka. Ebere katọrọ okwu TOE Ekechi bụ otu n'ime ndị nọ na isi ndị na-asị Okorocha na Uche Osuji kwapụkwapụ. Nzewuji sịrị na Ekechi na dị otu ha bụ ndị ụgha. Sikwa na ndị uweojii jidere ndị otu Ekechi ebe ha na ezuru ntụlịaka ịmemkpụrụ APC mere n'Imo steeti na-ohi. N'ihe onyonyo a Ekechi asaala Nzewuji were kwuo ka ya na ndị otu ha sịrị hụ ebubo ahụ.