Ọgụ na mgba aghasaala APC Congress n'Enugwu

Ndị APC mere ngagharị iwe
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị na-akwado APC mere ngagharị iwe n'Enugwu

Ndị otu Ndọrọndọrọ ọchịchị 'All progressives congress' (APC) nke Enugwu ejirila ịlụ ọgụ na ngagharị iwe kposaa ntuliaka ha kwesịrị iji họpụta ndị ọchịchị ọhụrụ na pati ha.

Tata bụ Mee 19 bụ ụbọchị APC hibere iji mee ya bụ nhọpụta na Nnamdi Azikiwe Stadium dị n'Enugwu.

N'ụtụtụ oge BBC Igbo rutere na ya bụ ogige egwuregwu, narị kwụrụ narị ndị mmadụ bucha akwụkwọ na-eme ngagharị iwe ma na-ekwuputa aha onye ha chọrọ ka ọ chịa ha.

Ozugbo oge ruru iji kpọpụta ndị aha ha dị n'akwụkwọ, ndị igwemmadụ juru ebe ahụ bidoro mewe ngagharị iwe sị na aha ha adịghị n'akwụkwọ INEC ji.

Nkenke aha onyonyo Tony Nwoye, onyeisi ndị APC n'Enugwu

Ndị uweojii nwara ike ha ịkwụsị ya bụ katakata na-ada mana ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ bara mebisịa akwụkwọ ma chụpụ ndị niile si APC Abuja nakwa INEC ezi.

Ndị uweojii jizi egbe na ọkụ oyibo nke a kpọrọ 'teargas' wee chụsaa ndị ahụ na-akpa aghara.

Ndị ọnụ na-eru n'okwu na ya bụ pati, dịka onye bụbụ gọvanọ Enugwu bụ Sullivan Chime, Sinetọ Ken Nnamani, Emma Enukwu, Ben Nwoye, Juliet Ibekaku, Okey Ezea, Baywood Ibe, na ndị ọzọ, jizi ọsọ gbapụ na ya bụ ogige.

Nkenke aha onyonyo Ndị bịara ntuliaka APC n'Enugwu

Isiokwu Ndị Emetụtara