Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Massob achọghị ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ na Mee 22

Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:

Nkenke aha onyonyo Ndị bịara ntuliaka APC n'Enugwu

Ọgụ na mgba aghasaala congress ndị APC mere n'Enugwu taa.

Ndị uweojii ji egbe na gas anyammiri chụsaa ndị mmadụ ka ha bidoro ime ngagharị iwe n'ọgbakọ e mere iji họpụta ndị ọhụrụ ga-achị na APC.

Ha bidoro mkpamkpa maka na ha sị na ha ahụghị aha ha n'akwụkwọ INEC ji.

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Otu ọzọ na-achọ nwere onwe Biafra ekeela ụbọchị 30 May ụbọchị ncheta Biafra

Ndị otu MASSOB ajụla na agaghị eme "onye ọbụla nọrọ na be ya" n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee a.

Fred Onyenaucheya bụ onyeisi ndị MASSOB n'Abia saụt kwuru na ndị mmadụ kwesịrị ịpụta n'igwe bịa nwere aṅụrị kama ịnọ n'ụlọ .

Na mba ofesi,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Meghan bụ onye nwere ọbara isi ojii mbụ a na-alụbata n'ụlọ eze ndị Briten n'ime ihe ruru afọ 100

Ụbọchị 19 nke ọnwa Mee bụ nke ụfọdụ ndị mmadụ agaghị echefu ọsịsọ, maka na ọ bụ ụbọchị Ọkparaeze Harry lụrụ Meghan Markle bụ onye na-eme ihe nkiri na mba Amerịka.

Ọlụlụ ha kpalitere ụka n'ụfọdụ ebe maka na nne Meghan bụ onye isi ojii.

N'egwuregwu,

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo A ga-ama mbe abụọ nke bụ oke n'etiti Chelsea na Manchester United

Ndị otu Chelsea na Manchester United ebidola egwu anyị ga-ama onye ike ga-agwụ iji mata onye ga-ebuli iko FA nke afọ a.

Onye ọbụla meriri n'etiti ha ga-ezute Manchester City ma afọ ọhụrụ bido, iji mara onye ga-ebuli ihe nrite akpọrọ community shield.

Gee nkeji anyị na mgbede a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa

Violet J kwuru na ọ nọ n'ụra mgbe ara ya bịara fagide ya n'olu chọrọ ị fagbu ya.

Mana o tiri mkpu ma bilie, ya bụrụ ara ya bịara fachie ya na nkọlọ na-ekweghi ya kuru ume.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAra m bụ oke ibu arụ nye m

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a