Gọọmentị etiti chọrọ igbu m - Wike

Nyesom Wike na Nwunye ya Image copyright NYESOM EZENWO WIKE FACEBOOK PAGE
Nkenke aha onyonyo Otebeghị aka ụlọikpe machiri EFCC na DSS ịchọ ihe n'ụlọ Wike

Aka na-achị Rivers steeti bụ Nyesom Wike etiela mkpu na gọọmentị etiti na-akwado igbu ya.

O kwuru na ha chọrọ igbu ya n'etiti igwe mmadụ ma bo ya n'amaghị ụma.

Wike kwuru nke a ụnyahụ ebe ọ gara ụlọụka dị na Port Harcourt.

O jikwa ohere ahụ kọwara ndị mmadụ etu otu ndọrọndọrọ ọchịchị gọọmentị etiti bụ APC sị eyi ya egwu.

Wike kwuru na ọ ga-eme ihe niile iji we hụ ọchịchị onye kwuo uche ya kwụ chịm na Rivers steeti.

O kwuru na atụmatụ ha agaghị abịa na mmezu makana Chukwu nonyere ya tinyere na-enwere izu ọjọ dị ukwuu maka Rivers steeti.

Mana gọmentị etiti agọnaghụ na ya bụ ebubo.

Onye ndụmọdụ onyeisiala Naịjirịa bụ Shehu Garuba zaghachiri si ndị mmadụ leghara anya ebubo aṅụrụma codeine na-ebute na-ekwesighị nzaghachi.

Shehu kwuru ka ndị mmadụ kwụsị iji atụmatụ ha kpe gọọmentị etiti ikpe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: