Naịjirịa nọ n'ọnọdụ ọgbaghara - Onaiyekan

John Onaiyekan

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Popu Benedict nke iri na isii bụ onye họpụtara Onaiyekan dika Cardinal n'ọnwa 2012

Maka oke ogbugbu na-eme na Naịjirịa ụgbụa, Archbishop na-ahụ maka ngalaba Katọlik dị na Abuja bụ Cardinal John Onaiyekan ekwuola na obodo a nọ n'ọgbaghara.

Onaiyekan kwuru na oke ogbugbu a adịghị mma n'ihu Chukwu nakwa n'oge eruola mgbe ndị isi ọchịchị ga-eji kwusi ya kpam kpam.

Mgbe ọ na-aka ụka akwamozu maka mmadụ iri na itoolu gunyere ndị fada abụọ ndị ana-enyo na ọ bụ ndị ọchịehi gburu n'ọnwa Epreelu, ọ rịo ka ndị Naịjirịa leghara ebum no obi ha dị iche iche ma zọpụta Naịjiria n'ibanye nnukwu ọgbaghara.

Onaiyekan kọwara ọnwụ ndị a dika ihe dị egwu ma na-ayọ ka a ghara ihụta ya dika ihe eji eme ndọrọndọrọ ọchịchị.

N'ọnụ ya, ''Obodo anyị nọ ọnọdụ ọgbaghara.''

'' Anyi ga-abanye nnukwu nsogbu maọbụrụ na anyị chọọ mmekọta maọbụ nkewa tụmadị dika agbụrụ anyị dị iche iche.''

Onaiyekan kpọkuru gọọmentị etiti ka ha mee ihe puru iche ga-akwụsị oke ogbugbu ndị a ma yọkwa ndị mmadụ ka ha saa anya ma chekwa nwanne ha.

Nkọwa foto,

Ndị ụka katọlik pụtara n'igwe maka akwamozu a na ngagharịiwe

N'otu ọgbakọ ahụ kwa,osote onyeisiala Naijirịa bụ Yemi Osinbajo yọrọ ka Chukwu kasie ma chekwa ndị Benue steeti.

Osinbajo kwuru na ndị na-egbu mmadụ na Benue steeti anaghị atụ egwu Chukwu maọbụ mmadụ.

Gọvanọ steeti ahụ bụ Samuel Ortom kwuru na ọ ụgboro atọ a na-eli ndị mmadụ nwụrụ nụ n'uju na steeti ahụ kamgbe mbido arọ 2018.

Nkọwa foto,

Ndị ụkọchukwu pụtakwara maka ya bụ emume

Ortom kwuru na ka ọdị ụgbua ,ụmụaka ruru puku 80 anaghị aga ụlọakwụkwọ na Benue steeti maka nsogbu na ogbugbu ndị ọchịehi na-eme.

Cheta na ndị ụka Katọlik niile nọ na Naịjiria mere ngaghariwe ụnyahụ maka ya bụ oke ogbugbu na-eme na Naịjirịa.

Akukọ ndi ga-amasi gi: