Aka akparala nwaanyị chọrọ iji ogbunigwe egbu ndị mmadụ

Boko Haram Image copyright @HQNigerianArmy
Nkenke aha onyonyo Boko Haram na-eji zi ụmụnwaanyị kwara ngwagha ogbunigwe mgbagbuonwe

Ndị agha nchekwa Naịjirịa akpọrọ Operation Lafiya Dole kwuru na-anwụchiri otu nwaanyị yi uwe ogbunigwe baa n'ụlọ ndị alakụba dị na Gashua Yobe Steeti n'isi ụtụtụ taa.

Anwụchiri nwaanyị a dịka ọ na-achọ ịgbapụ ogbunigwe ahụ mgbe ndị a na-achọ ikpe ekpere ụtụtụ.

Image copyright @HQNigerianArmy
Nkenke aha onyonyo Uwe ogbunigwe

Ozi a dị n'akwụkwọ osote onụ na-ekwutere ndị agha Naịjirịa bụ Col. Onyeama Nwachukwu wepụtara.

N'okwu ya "Nwaanyị a batara n'ụlọ ndị alakụba mgbe ha chọrọ ịmalite ekpere, n'atufughi oge ndị a nwuchiri nwaanyị ahụ ma nyefe ya n'aka ndị agha nọ n'Azare."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBoko Haram ji zi ụmụagbọghọ awakpo ndị mmadụ

Isiokwu Ndị Emetụtara