Ị ma ihe ole na ole e ji ama ofe ndị Igbo?

Eju

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

N'ala Igbo, ụfọdụ na-ahụ eju n'ọkụ, e nwekwara ike isi ya esi maọbụ ghee ya eghe

N'ajụghị ajụjụ, e nwere ihe ndị ọ ga-abụ ị hụ n'usekwu onye Igbo, ị mara na ọ na-akwado isi ofe?

Ebe ụfọdụ ndị agbụrụ ndị ọzọ ọkachasị ndị Yoruba, amụtaghị etu e si etinye 'ngwa ofe dị icheiche', bụ ihe ndị na-atụ ndụ mmanụ, onye Igbo amụtaghị etu e si esi ofe ghara itinyeju ya ihe ndị 'na-anọchi ụzọ'.

Ndị si n'akụkụ Kalaba nakwa Akwa Ibom, makwa etu e si etinyeju ihe n'ofe dịka ndị Igbo, nke nwere ike ịgbawoju onye na-amaghị etu e si ahọpụta nri anya.

BBC Igbo ga-egosi gị ihe ndị e ji ama ofe ndị Igbo.

1) Okporoko

Okporoko so n'ihe ndị Igbo ejighi egwu egwu ọkachasị abịa n'isi ofe.

Onye Igbo enweghị ike isi ofe na-etinyeghị okporoko, nke mere na ndị ahịa na-ere ya n'ibe n'ibe dịka isi ya, ọdụ ya nakwa etiti maọbụ nke akwọrisiri akwọrisi.

Okporoko na-enwe isi nke ya na-eto mmadụ akpịrị. Ụfọdụ na-agwọ ya agwọ ma taa ya na ụgba maọbụ abacha.

Okporoko batara Igbo ọfụma mgbe a na-anụ agha Biafra.

2) Ịsam

Ebe foto si, @Utakaegbe1

Nkọwa foto,

Ụfọdụ na-aghụpụta ya n'okpokoro ya tupu e jiri ya sie ofe

Dịka ndị Igbo, ịsam na-amasị ndị mbammiri dịka ndị Rivas, Krọss Riva nakwa ndị Delta.

Ọ na-amasị ụfọdụ ịghụpụta ya n'okpokoro ya tupu e sie, ebe ndị ọzọ na-esi ya na okpokoro ya ma mịpụta ya ma ha na-esuru ofe.

3) Ede

Nkọwa foto,

E nwere ọtụtụ ofe ede na-amasị ndị Igbo

Abịa n'ala Igbo, naanị mkpụrụ ofe ole na ole bụ ndị anaghị eji ede esi.

Ọtụtụ ofe dịka ofe ọha, ofe onugbu, ofe ụgụ, na ndị ọzọ ga-enwerịrị ede maọbụ ji maọbụ achị maka ime ụrị (ya bụ ime ka ọ kpụkọta ọnụ).

4) Akwụkwọ nri

Nkọwa foto,

Ofe ndị Igbo niile na-enwe akwụkwọ nri

Ndị Igbo anaghị eji akwụkwọ nri dị iche iche egwu egwu ọkachasị ma ha na-esi ofe.

Ụfọdụ oge, ha na-eji ihe karịrị otu ụdịrị akwụkwọ nri esi otu ofe. Ofe ndị dịka 'ofe Owere' na-enwe ọkazị nakwa ụzịza

Ihe akwụkwọ nri ji dị mkpa n'ala Igbo bụ na ọ bụ ya na-enye ofe aha. Ị gaghị akpọ aha ofe na-akpọghị aha akwụkwọ nri ị tinyere ya.

Ọmụmaatụ bụ 'ofe ọha', 'ofe onugbu', 'ofe ụgụ', 'ofe ọkazị' na 'ofe ụzịza'.

5) Akwụ

Nkọwa foto,

Ọ na-amasị ụfọdụ ịzụta mmanụ nri kama iji mkpụrụ akwụ

Ọtụtụ ndị Igbo na-ekwu na isi akwụ ma were mmiri na mmanụ ị sụpụtara na ya sie ofe na-aka ụtọ karịa nke e ji mmanụ sie.

Nkọwa ha bụ na mmanụ a na-ere n'ahịa agabigala ọtụtụ usoro na-ewepụ ụtọ ya na ihe ọ na-enye n'ahụ.

6) Ero

Nkọwa foto,

A na-efote ero n'ala ọkachasị oge udummiri

Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ndị Igbo niile ka ero na-amasị, mana ọ na-amasị ma ụtọ ya na uru ọ bara.

Ero nwere ụdị na ụdị, ma nke a na-akpọ 'atakata eloo' ma nke a na-akpọ 'ero mgbawa' maka na n'agbanyeghị awa ole ị siri ya, ọ gaghị edecha ede.

7) Ogiri

Nkọwa foto,

E nwere ụdịrị ogiri dị icheiche

Ị ma aha ihe ahụ na-esi ma ị tinye imi n'usekwu nwaanyị na-esi ofe ọha? Aha ya bụ Ogiri.

Ogiri nwere ụdị na ụdị, nke a na-akpọ 'ogiri okpei' nke bụ nke a dị na foto a dị n'elu, nakwa nke a na-eke n'akwụkwọ (ogiri Igbo) bụ nke a na-eji esi ofe nakwa agwọ abacha.

Ndị ọzọ bụ 'ogiri ụgba', 'ogiri egwusi'.

8) Eju

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Eju na-agbọnyụsị ọkụ ma a na-esi ya

Ụfọdụ ezinaụlọ na-ewe eju nke e ji 'Congo meat' mara dịka ihe ọpụrụiche.

Ọ bụghị 'anụ' a na-ahụkarị oge ọbụla maka na ọ na-apụtakarị n'oge udummiri, nke mere na a hụ ya ahụ, ọ bụrụ ihe a na-eri ka ọ bụ emume ruo oge ọkọchị ga-eme ka ọ laa.

Tupu e tinye eju n'ofe, ụfọdụ na-aghụ ya n'ọkụ maọbụ ghee ya eghe maọbụ sie ya n'ite mmiri ọkụ.

9) Ịsha

Nkọwa foto,

N'ezie, ndị obodo ndị ọzọ na-ejikwa ịsha esi nri

Ọ bụghị naanị ofe ka a na-eji ịsha esi. Mana ọ bụ ihe ndị Igbo anaghị echefu itinye n'ofe.

Ịsha na-enye nri ụtọ pụrụiche.

10) Azụ ọkpọọ

Nkọwa foto,

A na-ejikwa azụ ọkpọọ esi osikapa eji mmanụ nri sie nke a na-akpọ 'local rice' na bekee

A na-ere azụ ọkpọọ n'ibe n'ibe dịka okporoko.

Azụ ọkpọọ nwere ụdị na ụdị, na-enye ụtọ dị iche iche na nri.

E nwere nke a na-akpọ 'azụ asa', 'azụ isi', 'azụ bọnga' 'azụ mangala', 'azụ kpachaa' nakwa 'kpanla'

Mụtakwa etu e si esi ofe nsala ebe a.

Aha onyonyo,

I ma etu esi esi ofe nsala?