Akwụnakwụna: Ụlọikpe dị na Paris na-ekpe ụmụ Naịjirịa ikpe

Ụmụnwaanyị Image copyright Getty Images

Ndị ụlọikpe na Paris dị na mba France na-ekpe ụmụnwaanyị Naịjirịa 16 ikpe maka ebubo na ha na-eme ụmụnwaanyị ka ha dina nwoke n'ike .

E bidoro ikpe a kamgbe ụbọchị 14 ọnwa Mee nke a na-ekpe otu kpọrọ onwe ha 'Authentic Sisters.'

Ụmụnwaanyị asatọ agaala ụlọikpe ikwupụta n'ezie na e mere ha n'ike idina nwoke maka ego mgbe ha si Naịjirịa kpọrọ ha bịa.

Ikpe a metụtara ụmụnwaanyị ndị ọzọ ruru mmadụ 49.

A na-ebo ụmụnwaanyị ahụ na ha ji asị we kpọrọ ụmụnwaanyị na Naịjirịa dịka ha gwara ha na ọ bụ na ụlọ ebe a na-ere nri ka ha ga-arụ na Yurope. Mana oge ha ruru, e debere ha n'ime ụlọ nye ha okpunnabuenyi ka ha ga chọọ nwoke ha ga-edina.

Otu n'ime ụmụnwaanyị ihe a metụara kwuru na e buru ụzọ kpọgaa ha na arụsị dibia ka ha ṅụọ iyi na ha agaghị agwa ndị uweojii ihe ha na-eme.

N'ime mmadụ 16 a na-ekepe ikpe maka ịgba akwụna, ịkpọpụ mmadụ n'ike, mmadụ 11 n'ime ha bụ ụmụnwaanyị ebe mmaọdụ ise bụ ụmụnwoke.

Mmadụ anọ n'ime anọrọla n'ụlọ nga maka ihe ndị ọzọ ha mere. Ayaara mba France, ndị ọkaiwu gọọmenti kwuru na otu akwụna ha gara mba ndị ọzọ dịka mba Itali na Spen.

Otu na-enyere ụmụnwaanyị ahụ a kpọpụrụ n'ike aka inweta ndị ọkaiwu kwuru na ọ na-ahịa ụmụnwaanyị ndị gabigara ụdị ihe a ahụ ịpụta n'ụlọikpe.

Akụkọ ga-amasị gị: