Ndị uweojii achụsasịala ndị Ipob n'Awka

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdi uweojii achụsịala ndị IPOB n'Ọka

Ndị uweojii jiri anwụrụ anya mmiri chụsasịa ndị otu chọro ka ekewapụta mba Biafra site na Naịjirịa bu IPOB n'ebe ndị otu Ohanaeze Ndigbo na-ahazị nzụkọ ha akpọrọ "South East Summit on Restructuring of Nigeria" n'asụsụ Bekee taa.

Ndị Ipob kwubụrụ na ha akwadoghị nzuụko a, na ihe ha chọrọ bụ nkewa site na Naịjirịa ebe ndị Ohanaeze chọrọ nhazi Naịjirịa.

Onye ntaakụko BBC Igbo no n'ebe a na-eme nzụkọ kwuru na ndị IPOB chọbụru ibanye ebe a na-eme ya bụ nzụkọ ga-yasasia ihe a na-eme, maọbụ kwụsị ndị mmadụ ịbanye ebe ahu kpam kpam , mana ndị uweojii ruru 500 nọ n'ọrụ nchekwa n'ebe ahụ ekweghi.

Ha gbaliri egbe elu ma tụo anwụrụ anya mmiri i ji chụsasịa ndị Ipob ahụ.

Ugbu a, nzụkọ ahụ na-aga n'ihu.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a