Ndị na-ere mmadụ atọọrọla ụmụakwụkwọ na Benin

Ihe ruru mmadụ iri 150 bụ ndị si mba Libya lọta n'ọdọ ụgbọelu dị na Legọs n'abalị ise nke ọnwa Disemba, afọ 2017. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ihe ruru mmadụ iri 150 bụ ndị si mba Libya lọta n'ọdọ ụgbọelu dị na Legọs n'abalị ise nke ọnwa Disemba, afọ 2017.

Ndị na-atụ mgbere mmadụ atọrọla ihe ruru ụmụakwụkwọ 100 n'otu ụlọakwụkwọ dị na Benin, Edo Steeti n'ime ọnwa anọ.

Onye ndụmọdụ pụrụiche nke Gọvanọ Godwin Obaseki n'okwu ịtụ mgbere mmadụ bụ Solomon Okoduwa kwuru na ọ bụ ndị nkuzi ha gwara ya nke a.

O kwuru na ndị ọtụ mgbere adịla n'ebe ụmụakwụkwọ nọ.

Okoduwa kwuru nke a ụnyaahụ na Benin n'emume akpọrọ one advocacy dịka ọṅụrụ iyi na gọọmentị agaghị ekwe ka nke a gaa n'ihu.

O kwuru na gọọment ehiwela ndị ọrụ ọtawike na-ahụ maka ịtụmgbere mmadụ na Steeti ahụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụ Naịjirịa si mba Libya lọta

Okoduwa dọrọ ụmụakwụkwọ a akanantị, ka ha saa anya mmiri maka mmadụ ọbụla ịghọgbu ha n'imee njem gaa Libya

"Site ugbu a gawa n'ihu mee mkpesa maka onye ọbụla ga-asị mee njem na Yurope, atụmatụ aha bụ ịkpọfe gị ịkpa Sahara na osimmiri mediterranean."

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a