Ndị IPOB bu ọgbaghara bata n'ọgbakọ Ohaneze Ndịgbo n'Awka
Ogbaghara ndị IPOB
Mmemme ahụ Ọhaneze ndị Igbo hiwere n'Awka bụ nke emere taa n'ọnọdụ ịchị obi n'aka n'ihi ngagharị iwe nke ndị Ipob mere n'ebe ahụ.
Ngwa ngwa ọgbakọ ahụ malitere, ọtụtụ ụmụnwọke na ụmụnwaanyị karịrị nari abụọ wakporo Ekwueme Square ma gụrụ egwu na-agagharị n'ezi ogige ahụ.
Ndị Eze Igbo
Ha na-ekwu na ha achọghị nkata ahụ a chọrọ ịkpa, kwuo kwa na ha achọghị ya bụ nghazigharị obodo bụ restructuring na Bekee.
Ufọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo
Ndị uweojii karịrị narị abụọ na echekwa ọnụ ụzọ ogige ahụ nche, jiri egbe nakwa anwụrụ anya mmiri nke ana akpọ 'teargas' wee chụsasịa ndị ahụ kpọrọ onwe ha Ipob.
Ndị odozi akụ n'ala Igbo
Ndị ụkọ chukwu sị n'ụlọụka dị iche iche ji ekpere wee bido ọgbakọ ahụ.
Onye bubụ gọvanọ ụlọ ọbaego ala Naịjirịa bụ Charles Soludo gụpụtara akụkwọ gosiri ọnọdụ ndị Igbo bụ nke otu dị iche iche jikọrọ ọnụ ma wepụta.
Ndị ọbịa si mpaghara ala Igbo dị icheiche
Onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Nnia Nwodo kelere mmadụ niile bịara ọgbakọ a ma kwuo na ihe niile soludo kwuputara bụ ihe ha jịkọrọ aka ọnụ depụta.
Ndị ụkọchukwu bịara ọgbakọ a
Dịka Nwodo ka kpụ okwu n'ọnụ mgbe ụmụnwaanyị bidoro ngagharị iwe n'ime ogige.
N'atufughi oge ndị ruru mmadụ narị abụọ n'ọnụ ọgụgụ jịrị egwu, esemokwu na ọgụ site n'ọgbọ Ekwueme square pụọ ebe ọgbakọ ahụ gawara n'ihu.
Akụkọ ga-amasị gị:
Nwodo: Ndigbo agaghị alụ agha nnwereonwe ọzọ
Onyeisi Ohanaeze bụ Nnia Nwodo ekwuola na Igbo agaghị alụkwa ọgụ nnwereonwe ọzọ.