Ọnọdụ ndị Igbo na Naịjirịa adịghị mma
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Bob manuel: A na-akpagbu ndị Igbo na Naịjirịa

Nwafọ Igbo ama ama n'ime ihe nkiri Nollywood bụ Bobmanuel Odogwu kwuru na ọnọdụ ndị Igbo na Naịjirịa bụ ihe nwute.

O kwuru nke a mgbe ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'Enugwu.

Odogwu kwuru na ndị Igbo bụ ndị mbụ na Naịjirịa, mana e bidoro na akpagbu ha ma kpagide ha n'akụkụ.

O kwuru na mgbe a lụchara agha Biafra, na a naara ndị Igbo ihe niile ha nwere.

Mana n'ime afọ iri anọ, ndị Igbo wee pultekwa dịka osiisi achara ma soro n'ihe niile a na-eme na Naịjirịa.

Odogwu gara n'ihụ rịọ ndị Igbo ka ha nwee otu obi ma pụta n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa, i ji were ezi ọnọdụ ruru ha.