Gịnị na-ebute esomokwu n'etiti uweojii na ndị agha?

Ndị uwe ojii na ndị agha Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Oteela ndị uweojii na ndị agha na-enwe mkpakpa di icheiche na Naịjirịa

Na Naịjirịa, anyị anụọla ọtụtụ oge na ndị agha na ndị uweojii Naịjirịa na-akụnye aka, nke na-ebute ogbugbu mmadụ na nkwarị akụnaụba.

Ọtụtụ oge, ọ bụ ihe na-adịghị mkpa bụ ihe na-ebuta mkpamkpa a, dịka nke mere na Yobe steeti n'ime ọnwa Epureel n'afọ 2017.

Dịka akụkọ siri kwuo, ndị uweojii na ndị agha n'ime steeti ahụ busoro onwe ha ọgụ maka esemokwu gbasara enyin nwaanyị ha.

Otu onye bụ onyendu ndị agha Naịjirịa boro onye uweojii na ọ napụrụ ya enyin nwaanyị ya.

Ndị uweojii na ndị agha na steeti ahụ lụrụ nnukwu ọgwụ maka okwu a. Ka anwụru kopuru, ozu ndị uweojii anọ na otu onye agha tọgbọrọ.

Ọzọ dị ka ya mekwara na obodo Calabar n'ime ọnwa Dezemba na afọ 2016, na mkpa mkpa nke a, otu uweojii na ndị agha gbatara onwe ha mgbo mana onweghị onye meru ahụ maọbu nwụọ.

Ihe a na-eme na-agbogwoju ndị mmadụ anya, nke mere ha jiri na etinye ọnụ na ya bụ okwu na social media dịka ‏@FinallymaRvin sịrị de n'ebe.

O dere na ya ahubeghị ebe ndị ọrụ gọọmentị abụọ na alụso onwe ha ọgụ na uwa nke a, mana na Naịjirịa ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa na aluso onwe ha ọgụ maka onye ga-eche obodo maka mwakpo Boko Haram.

Mkpamkpa ọzọ mere n'etiti ha bụ nke mere na ọnwa Dizemba na afọ 2017 na Ekiti steeti.

Na mkpamkpa nke a, ndị uweojii na ndị agha were nghọtaghị onwe ha maka onye ikpe ga-ama maka ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị atọọrọ na Dapchi.

Cheta na ndị uweojii na ndị agha nọ na Yobe oge Boko Haram tọrọ ndị ụmụakwụkwọ a.

Ihe nkiri na-ewu ugbua bụ nke gosi ka ndị uweojii na alụsọ otu onye Civil Defence ọgụ, ha na-achọ ị napụ ya egbe ya n'ike.

Nke a mere na Akwa Ibom steeti.

Gịnị butere udi emume a?

Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ọ gịnị mere na ndị ọụ nchekwa enweghị ike ịdị n'udo?

Oge ọbụla ndị ntaakụkọ jụrụ ndị uweojii ajujụ ịmata ihe mere udi ihe a na-eme oge ọbụla, ha asị na ọ bụ obere esemokwu dị na-etiti ha.

Ha kwukwara na ha abụọ na arụkọ ọrụ ọfụma ọfụma.

Mana otu ọkaiwu aha ya bụ Chuwkwuemeka Eze, gwara BBC Igbo na udi emume a na-ekesa mmerikọrịta dị na-etiti ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa.

N'ọnụ okwu Eze: "Ogbaghara dị icheiche n'eme na mpaghara Naịjirịa, ọ dị nwute na ndị kwesiri na-echekwa udo na ala bụ zị ndị na ebuso onwe ha ọgụ".

Olisa Metuh adala n'ụlọikpe

Ndị uweojii achụsasịala ndị Ipob n'Awka

Isiokwu Ndị Emetụtara