Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Ipob chọrọ ịtinye aja na garị Ọhaneze

Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ipob chọrọ nwere onye Biafra ebe Ọhaneze ndị Igbo chọrọ ka ahazigharịa Naịjirịa

Ndị uweojịị ashụsala otu Ipob ebe ha bịara ị bute ọgbaghara na nzụkọ ndị Ohaneze ndị Igbo mere maka hazigharịa Naịjirịa. Ndị amama n'ala Igbo na ndị mba mmiri bịara ọgbakọ ahụ.

Na mba ofesi, United Arab Emirate sị ndị mba uwa bịawa

Image copyright @HHShkMohd
Nkenke aha onyonyo Ọkparaeze obodo Dubaị

Ndị mba United Arab Emirate emeghela ụzọ be ha sị onye ọbụla jị ịkpeghe ịmeghe ụlọọrụ maọbụ ịzụ ahịa batawa.

Ha na enye visa afọ iri zuruezu maka onye ọbụla tozuru ịme nke a.

Olisa Metuh dara n'ụlọikpa Abuja n'ụtụtụ a

Image copyright Channelstv
Nkenke aha onyonyo Metuh na-agọ na aka ya adịghị na mpụ na aghụghọ

Onye ode akwụkwọ mgbasa ozi otu PDP bụ Olisa metuh atụbọla n'ụlọikpe Abuja n'ụtụtụa a.

A na ebo Metuh ebubo nde narị Naịra anọ nke asị na o bubara mgbe ha na-achị.

N'egwuregwu,

Nkenke aha onyonyo Alvaro Morata nke spain na-agbara Chelsea

N'egwuruegwu, dịka mba Spain họpụtara ndị ga eso asọmpị iko mba uwa nke a afọ a, ọpụtala ihe na Alvaro na akpara Cheslea bọlụ agaghị esọ sọọ mpị ahụ.

Nwaamadịa, n'ọba ọzị twitter ya nabatara ọnọdụa na obi ọcha.

Gee nkeji anyị na mgbede a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdi uweojii achụsịala ndị IPOB n'Ọka

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a