Anyi achọghị Buhari na Atiku - Otu ugwu hausa

Mohamadu Buhari Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Muhamadu Buhari agaala ụlọogwụ ugboro ole na ole maka nleta onwe ya

Otu kporo onweha 'The Coalition of Northern Groups' na bekee gwara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhuri na onye chiburu dịka osote onyeisiala n'oge garaaga bụ Atiku Abubakar na ọ ga-adị mma maọbụrụ na ha abụọ wepuru aka n'ime ọsọ ị banye n'ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala n'afọ 2019.

Otu a kwuru na ha na-ekwusi okwu ike makana ha abụọ bụ Buhari na Atiku karịrị afọ iri asaa na kwa na ndị ntorobia kwesiri ị bụ ndị ga-achị Naịjirịa ugbua na kwa n'iru.

Ha kwukwara na ọ bụ ndị chiburu Naịjiria n'oge garaaga burukwa ndị ka goro nka bụ ndị mebiri Naịjirịa, na kwa oge eruola ndị ntorobia buru Naịjirịa gawa ala ekwere nkwa.

Otu ha kwuru okwu a n'ime akwụkwọ a dere na ngwụcha ọgbakọ ha na Kaduna n'ụbọchị Monde.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Atiku Abubakar anwaala ugboro ole na ole ị bụ onyeisiala Naijiria

Cheta n'ọbụ ndị otu a sị ka ndị Igbo bị na mpaghara ugwu hausa kwara lawa.

Mana ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Garba Shehu azaala otu a.

Shehu kwuru na onweghị iwu ọbụla na Naịjirịa kwuru na onye karịrị afọ iri asaa anaghị enwe ike ị so n'ọsọ ịzọ ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala Naịjirịa.

Onweghị ihe Atiku Abubakar kwuru ugbua maka okwu a otu nke a na-ekwu.

Otu a kwukwara na ihe kachasị dị ha mkpa bụ ka gọọmentị leba anya na ntụlịaka maka ị nwere onwe nke a kpọrọ 'referendum' na bekee.