Ndị ụka katọlik n'Enugwu na-esonye na ngagharị iwe taa

Ndị na-eme ngagharị
Nkenke aha onyonyo Igwurube mmadụ pụtara maka ngagharị iwe ahụ na steeti dị iche iche na Naịjirịa

Nghagharị iwe ndị ụka katolik bidoro taa na steetị niile dị na Naịjirịa dika ndị na-achị a siri kwu.

Ndị ụka katọlik n'Enugwu adịla njịkere isonye ndị ogbo ha na Naịjịrịa niile wee gosipụta iwe ha maka ogbugbu e gburu onye ụkọchukwu na Benue.

Ngagharị iwe nke ndị Enugwu ga-ebido n'ụlọụka Holy ghost Cathedral Enugwu ebe Bishop Callistus Onaga ga-ejị nnukwu nchụ aja wee malite ya tata.

Onye isi ụka katọlịk n'ụwa niile bụ Pope Francis ezugalarị ndị iche iche si Rome gas Benue ije chọpụta ihe kpatara ihe arụ ahụ jiri mee.

A na-enyo na ndị gburu onye ụkọchukwu ahụ bụ ndị ọchụehi na-akpa ike na ya bụ ebe.

Nkenke aha onyonyo Ha kara ụka tupu ha bido ya bụ ngagharị iew

Otu jịkọrọ ụka Kraịstị na Naịjirịa niile bụ CAN n'aha ịchafụ emebuola nke ha, ugbua bụ ndị ụka katọlik.

Nagharị iwe ahụ na-emekọta ọnụ na steeti dị icheiche na Naịjirịa.

Anyị ga na-ewetara gị ka ya bụ ngagharị iwe ka ọ si aga.

Akụkọ ga-amasị gị: