A nwụchiela nwa mahadum ji egbe ga ohi

Gideon na Afeez
Nkenke aha onyonyo Gideon bụ nwa onye ndọrọndọrọ ọchíchí

Ndị uweojii nọ na Legos anwụchiela Gideon Bamidele, 19, nwa mahadum (Caleb University),na enyi ya bụ Afeez Anifowoshe, 20,maka iji egbe ezu ohi.

Gideon, onye nọ afọ nke atọ dịka onye na-agụ Kọmputa Sayensi na mahadum ahụ na enyi ya ji egbe ụmụaka chọrọ ịnapụ a kpọrọ Olugbenga Otun, onye ọkwọụgbọala Uber ụgbọala ya oge nkata gbudoro ha.

Ma oge ha rutere nso ebe a kpọrọ Itowolo Bridge, Gideon wepụtara egbe ụmụaka chọrọ ịnapụ ọkwọụgbọala ƴa.

Ọ bụ ka ha na nwoke ahụ na-agbarita ka ha nwere ihe mberede mere ka ụgbọala ahụ ṣọgharịa.

Onye ọkwọụgbọala ahụ tiri mkpu enyemaka nke kpọkọbara ndị mmadụ nke gụnyere ndị uweojii.

Oge onye ntaakụkọ BBC gbara Gideon ajụjụ ọnụ ihe tinyere ya n' izu ohi, o kwuru na ọ bụ ajọ enyi nakwa ịnụ anwụrụike.

Nkenke aha onyonyo Gideon Bamidele na Afeez Anifowoshe chọrọ ịnapụ onye Uber ụgbọala Toyota Corolla ya

Gideon, onye bụ nwa otu onye ndọrọndọrọvchịchị a maara ama na mpaghara Surulere (nke a chọghị ịkpọ aha ya) kwuru n'anya mmiri sị: "Amaghị m ihe banyere m n'ime mere ka m banye na Shoprite zụrụ egbe ụmụaka ụbọchị ụka ma gwa nwata nwoke imara ka anyị were ya rụọ ọrụ."

Onyeisi ndị uweojii na Legos bụ Imohimin Edgal kọwara na ndị uweojii na- eme nyocha n'okwu ahụ. Na ha ga-akpụpụ ha ụlọikpe ma ha mecha nchọpụta ha.

Akụkọ ga-amasị: