Ngagharịiwe ndị Katọlik: Ka o si ga

Ndị ụka Katọlik Image copyright Michael Obinna
Nkenke aha onyonyo Igwurube mmadụ pụtara na kadụna maka ngagharịiwe ahụ na steeti dị iche iche na Naịjirịa

Ndị Katọlik na Naijiria niile mere ngagharịiwe iji gosi obi mwute ha maka oke ogbugbu mmadụ na-aga na Naijiria.

N' ọnwa Epreelụ, ndị e chere na ha bụ ndị Fulani ọchịehi gburu ndị ụkọchukuw abụọ na ndị ụka Katọlik iri na asaa ndị Fulani ọchịehi gburu na Benue.

Ọgbakọ ndị Bishọp gwara ndị ha na-achịkọta ka ha mee ngagharịiwe taa dịka a na-eme emume akwamozu ndị ahụ nwụrụ taa bụ Tuusde na Benue.

N' okwu ya oge o du ndị ụka kaolik na ngagharịiwe, Bishọp ụka Katolik na Port-Harcourt bụ Camilus Etokudoh kwuru oke mkpa ndụ mmadụ dị ma katọọ oke igbu mmadụ.

O kwuru na ngariiwe ahụ abụghị maka okwu ndọọndọrọ ọchịchị.

"Ndị ọchịehi ewegharala ọtụtụ ala anyị dịka anyị gara n'ihu na edegara onyeisiala Buhari akwụkwọ maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa."

Image copyright Michael Obinna
Nkenke aha onyonyo Ndị Katọlik na Kadụna bucha ozi na-ekwu ka gọọmenti kwụsị oke ogbugbu mmadụ

N'Enugwu, ndị nne, nna, ụmụaka na ndị chiri echiche n'ụka pụtara n'igwe maka ngagharịiwe.

Nkenke aha onyonyo Ndị e chiri echi na Katolik sonyere na ngagharịiwe e mere n'Enugwu

Akụkọ ndị ga-amasi gi: