Nwoke egbuola nwunye ya maka ekworo

Ịga
Nkenke aha onyonyo Na nso nso ndị anwụchiela maka igbu dị ha maọbụ nwunye ha na-arị elu

Otu ojiegoachụego a kpọrọ Tochukwu Chukwu, onye Uli na Anambara Steeti, egbuola nwunye ya n' Oshodi, Legos maka ebubo ịgba n'ilo.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Chike Oti gwara onye ntaakụkọ BBC na aka kpara nwa amadị ahụ oge ọ gara ịtụfu ozu nwaanyị a nke ọ sụnyere na bọket n'ụzọ ụtụtụ.

Oge ndị agbataobi jụrụ ya ihe o bu n'isi ma o nweghị ezi nkọwa o nyere ha, mere ka ha manye ya ka o mepe ya.

Ha were hụ ozu nwaanyi o jiri akwa gbuchie ma kụwa ya ihe mecha were ya nyefe ndị uweojii.

Oti kọwara na nchọpụta nke onyeisi uweojii nke ogige ndị uweojii, Akinpelu Police Station kwuru merela na-egosi na ọ bụ nsogbu ezinaụlọ.

Okwukwara na ndị uweojii jichiri nwoke ahụ ganye na ha mechaa nyocha zuru oke, ebe ka tinyekwara ozu nwunye ya n'ụlọozu maka nchọpụta.

Nkenke aha onyonyo Imohimi Edgal,Kọmishọna ndị uweojii na Legos steeti agbala ndị omekome ka ha chọrọ ezigbo ọrụ ruwa maọbụ kwarapụọ na steeti ahụ.

Ndị mara nwoke ahụ ebe ọ na-azụ ahịa n'ahịa Ladipo dịkwa na Legos, kwuru na ọ bụ ekworo mere nwoke jiri gbuo nwunye ya.

Otu onye a chọghị ka a kpọ aha ya kwara BBC na nwoke ahụ bụ onye gabuola mkpọrọ afọ ise ma bụrụkwa onye na-aṅụ anwụrụike.

Akụkọ kọro na nwoke ahụ gara njem ma kpọ nwunye ya na ekwenti, olu nwoke azaa ya nke mere ka ya na ya lụwa ọgụ.

Akụkọ ga-amasị gị: