Okorocha: Anaghị m apụ n'APC

APC na Imo steeti Image copyright Rochas Okorocha/twitter
Nkenke aha onyonyo Ha na-ebo Okorocha ebubo na ọ chọrọ ka ọgọ ya bụ gọvano Imo steeti

Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha, ekwuola na ọ gaghị eji maka onye ọbụla pụọ na pati ya bụ APC maka na o so na ndị bidoro ya na steeti ahụ.

O kwuru nke a ka akụkọ na-agagharị na ya bụ Rochas chọrọ ịlaghachị otu APGA bụ ebe ọ nọbu.

Ọ bụ Sam Onwuemeodo bụ ọnụ na-ekwuchitere Okorocha zipuru ndị ntaakụkọ okwu a.

O kwukwara na Okorocha anaghị apụụ na APC makana ọ bụ ya mụpụtara paatị a na steeti ahụ.

Onwuemeodo n'ime akwụkwọ a dere na: "Ọ bụ Okorocha mere ka APC bụrụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị amaama na Naịjirịa maka ndị niile o kpọpụtere n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA."

O kwuru na ndị na-atụ asị na Okorocha apụọla n'APC na-eme ihe a makana ahụ na agbakasị ha, na kwa obi ha na-ama ha ikpe.

Onwuemeodo kwuru na ndị na-atụ asị a amaghị Chukwu makana ha kwukwara na Okorocha tọgbọrọ atọgbọ n'ụlọọgwụ.

Na ngwucha, o dere na Okorocha anaghị ekwe ka ndị a na-aghọrọ mkpụrụ n'ebe ha na-akụghị mkpụrụ.