Ihe ị kwesiri ịma maka Unai Emery

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Unai Emery

Arsenal ekwuola onye nchịkọta ha ọhụrụ bụ Unai Emery.

Unai kwuru na obi dị ya ụtọ maka ọrụ ọhụrụ a Arsenal nyere ha.

Otu n'ime ndị onyeisi Arsenal bụ Ivan Gazidis kwuru na Emery bụ onye onyeọbụla chọrọ ga-abụ onye ga-anọchite anya Arsene Wenger.

Emery dị afọ iri anọ ji afọ iri abụọ na abụọ chiburu otu PSG tupu ọ gawa Arsenal.

Onye bụ Unai Emery?

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Unai Emery na otu ya PSG bụ ndị bulịrị iko France League 1

Emery nwere mmerị ọtụtụ oge na asọmpị nke mpaghara France na kwa buru iko anọ na asọmpị a.

Emery bụkwa onye nchekọta ndị otu Sevilla oge a buru iko Europa League ugboro atọ.

Ọ bụ onye gbagburu bọọlụ n'ime otu Real Sociedad na Leganes tupu ọ bịdọ ọrụ nchịkọta ya n'afọ 2004.

Emery abụọla onye nchịkọta otu dị iche iche dịka Valencia, Sevilla, Spartak Moscow na PSG.

'Ọrụa atọọgboola m'

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Unai Emery bụ onye ama ama maka

Unai Emery kwuru na ya anaghị akwatu obi ndị na-etiri Arsenal mkpu.

O kwukwara na ya ga-eme ihe Wenger enweghị ike ime, ya-abụ ị meri iko Champions League.

Ndị ọzọ Arsenal nyochara maka ọrụ a bụ Patrick Vieira, Thierry Henry, Mikel Arteta, na onye bụbụ onye nchịkọta otu Barcelona coach bụ Luis Enrique na onye nchịkọta Juventus' Massimiliano Allegri.

Isiokwu Ndị Emetụtara