Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Trump na Jong-Un a ga-ezukọ?

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Rochas agaghị apụ APC

Nkọwa foto,

Okorocha ga-aritu n'ọkwa gọvanọ Imo steeti na 2019

Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha, ekwuola na ọ gaghị eji maka onye ọbụla pụọ na pati ya bụ APC maka na o so na ndị bidoro ya na steeti ahụ.

O kwuru nke a ka akụkọ na-agagharị na ya bụ Rochas chọrọ ịlaghachị otu APGA bụ ebe ọ nọbu.

'Naịjirịa nọ n'ọgbaghara'

Nkọwa foto,

Poopu mere Archbishop John Onaiyekan kadịnal n'afọ 2012

Onye nchịkọta ndị ụka katọlik niile nọ n'Abuja bụ Archbishop John Onaiyekan, ekwuola na Naịjirịa nọ n'ọdụ ọgbaghara maka ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na mba a.

O kwuru nkea ka ọ na-aka ụka akwamozu maka mmadụ iri na itoolu gụnyere ndị fada abụọ ndị a na-enyo bụ ndị ọchiehi gburu na Benue n'ọnwa Epreelụ.

Nzukọ Trump na Jong-Un ọ ga-enwe isi?

Nkọwa foto,

Trump na Jong-Un kwesịrị inwe nzukọ n'ụbọchị 12 nke ọnwa Juun

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na nzukọ ya na onyeisiala Nọt Korea bụ Kim Jong-Un nwere ike ghara ịbịa na mmezu.

O kwuru na e nwere ọnọdụ ndị ha chọrọ mana ọ bụrụ na ha enwetaghị ha, nzukọ ahụ agaghị eme.

O kwukwara na omume Kim Jong-Un agbanweela kamgbe ha kwenyere inwe ọgbakọ a.

N'egwuregwu

Skip Twitter post, 1

End of Twitter post, 1

Ndị bọọlụ na-amasị toro ndị Super eagles ike n'agbanyeghị na ndị otu Atletico Madrid ji ọkpụ atọ asatara abụọ merie ha n'asọmpi enyi na enyi a gbara n'Uyo ụnyaahụ.

Skip Twitter post, 2

End of Twitter post, 2

Gee ya na nkeji nke ututu a:

Lee ihe nkiri taa