Buhari : Ndị omeiwu Naịjirịa bụ ndị umengwụ

Ebe foto si, @bashirahmad
Muhammadu Buhari kwuru na ọ ga-azọ ọchịchị n'afọ 2019
Okwu onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ọtụtụ ndị omeiwu na-anara ego na-arụghị ọrụ ọbụla, nwere ike ikpasu ụfọdụ ndị mmadụ iwe.
Ka Buhari na ndị otu na-akwado ya bụ 'Buhari Support Organisation (BSO)' zukọrọ n'Abuja, o kwuru ọtụtụ ihe nke gụnyere na ndị omeiwu na-egbu oge na-agbanyeghị na ụfọdụ n'ime ha anọruola afọ iri n'ụlọ omeiwu.
O kwuru; "bọjeetị afọ a na nke afọ gara aga m wegara n'ụlọ omeiwu bụ nke kachasị na mmapụta akụ e ji arụ ọrụ gbara ọkpụrụkpụ; ọ karịrị naịra otu tari na nde atọ (1.3trillion)."
"Ka onye ọbụla pụta bịa maa m aka n'ihu ọha n'ụlọ omeiwu. Gịnị ka ha na-eme kemgbe? Ụfọdụ n'ime ha anọọla ebe ahụ afọ iri.
Gịnị ka ha na-eme kemgbe? Ya mere, n'ezie, ebe o si ka mma bụ na ekwuru m ya na anyị enweghị mba ọzọ na-abụghị Naịjirịa."
Buhari metụkwara aka n'ihe gbasara nde dọla iri isii nke ndị chịbụrụ Naịjirịa kwuru na ha tinyere n'ọkụ:
Mana oge anyị kpọrọ otu onye omeiwu n'ekwentị bụ Mao Ohuabụnwa, o kwuru na ya achọghị ikwu ihe ọbụla gbasara ya bụ okwu.