Obasanjo na Buhari: Ọ bụ maka ntuliaka 2019- Ndị Okachamara

Buhari-Obasanjo Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Buhari na Obasanjo bụ generalụ Naijiria chiarala Naijiria dịka ndị agha nakwa dịka ndị akwa agbada

Ndị ọkachamara n'okwu ndọrọndọrọ ekwuola na nrụrịtaụka dị n'etiti Buhari na Obasanjo bụ maka ndọrọndọrọ ọchichị 2019.

Ha kwuru na ọ bụrụ na ọ bụghị okwu ndọrọndọrọ ọchịchị 2019, na dịka Buhari na-ebuagha megide mmerụaka, na ihe ọ kara ime bụ ihiwe nyocha ebubo na Obasanjo mefuru ijeri dọla 16 kama ime ya okwu akwụkwọ akụkọ.

Onyeisiala Muhammadu Buhari tupụrụ onye chịburu dịka onyeisiala bụ Olusegun Obasanjo okwu si na otu onye bụbụ onyeisiala enweghị ike ịkọwa otu ya na ijeri dola iri na isii($16bn) siri ga.

Ebe Obasanjo sara ya si na ebubo ahụ achịtaghị aja n'ihi na ọchịchị gara aga nyochara ya ma ha atụtaghị ya aja.

Obasanjo gwara Buhari ka ọ ga gụọ akwụkwọ o dere a kpọrọ, 'My Watch," ka ọ hụ ihe nchọpụta mere oge eboburu ya ebubo na o mefuru ijeri dọla 16 maka nhazighari ọkụ latrik na Naijiria na nchọpụta so ya.

N'okwu ya onye ọkaiwu bụ Chukwuemeka Eze kọwara sị, "Ihe niile bụ okwu 2019.

Ya bụrụ na ọbasanjo dọnyere ya ukwu maka 2019, ha agaghị na-ekwu okwu ọkụ."

N'otu olu ahụ, onye ọkachara mara n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Sam ọlise sị na Buhari kpalitere okwu ahụ iji bọọ Obasanjo maka nkatọ niile ọ na eme ya na nsonso a.

Eze kwụrụ na nrụrịtaụka nnukwu mmadụ abụọ dị mma n'ihi na ọ ga-eme ka ndị Naijiria mara ka ego ha si aga.

Olisa gara n'ihu nye onyeisiala ndụmọdụ sị, kama iji okwu ahụ mee okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ kaa ya ọbi ya malite nyocha ka ego ahụ siri gaa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: