Ndịagha wakporo ụmụnwannyị na-gba ọsọ ndụ n'ike - Amnesty

ndi awakporo be ha. Image copyright Huw Evans picture agency
Nkenke aha onyonyo Ndị awakporo be ha na Borno n'afọ 2015

Ndị na-ahụ maka ikike onwe nke akpọrọ Amnesty International ekwuola na ndị agha Naịjirịa na-awakpo ụmụnwaanyị na-agba ọsọ ndụ n'ike n'ọwụwa anyanwụ n'ugwu Naịjirịa.

N'ime akwụkwọ ọhụrụ ndị Amnesty dere, ha sị na ndị agha Naịjirịa wakporo ụmụnwaanyị a ka ha nọ n'ebe ndị gbara ọsọndụ na-anọ na Borno steeti.

Ha Kwụrụ ndị agha a jiri ahụhụ dị n'ebe ahụ were rata ụmụnwaanyị ha wakporo.

Ndị Amnesty kwurụ na ụmụnwannyị itoolu bụ ndị kwuputara ihe ndị agha mere ha.

Otu n'ime ha sị "Ị ga-ahụ onye agha ji ihe oriri n'aka ga-agwa gị: "Ị hu m n'anya, were nrị a." Ha ga-asịkwa: 'soro anyị, nke ga-eme ka anyi che maka ụmụ anyi na-ebe akwa maka nrị. Ị nata nrị ahu, ọ ga alaghachịte ka gi na ya nwe mmekọrịta, ya bụrụ na-ikweghị, ọ wakpo gị n'ike."

Otu onye na ekwuchịtere ndị agha Naịjirịa katọrọ akwukwọ ndị Amnesty dere, na-ekwu na okwu mwakpo a akwụghi ọtọ.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndịagha Naịjirịa n'ọrụ nchekwa na-ibuso ndị Boko Haram agha na ọwụwa anyanwu nke ugwu Naịjirịa

Ndị Amnesty na onwe ha na-akpọ ndị mba Briten ka ha hazigharịa mmekọrịta ha na ndị agha Naịjirịa.

Mana ndi mpaghara gọọmentị Briten na-ahụ maka nchekwa sị na ha na npaghala ndị agha Naịjirịa a na-ebo ebubo a.

Ndị Amnesty nakwa asị gọọmentị Naịjirịa ka ọ tinye anya na okwu a.

Nke a abụghị nke mbu Amnesty na-ebo ndi agha Naịjirịa ebubo, mana onwebeghị nke ha na-ekwe na ha mere.

Akwụkwọ ewepụtara n'ọnwa Eperelụ nke afọ gosiri na ihe ruru mmadu nde 1.8 gbara ọsọ ndụ maka mkpam mkpa ndị Boko Haram na agha ndị agha Naịjirịa na-ebụso ha.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a