NCDC: Anyị dị njikere maka Ebola

Ndị ọrụ ahụike Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mbaụwa toro Naịjirịa maka etu o siri hazie ọnọdụ oge Ebola batara

Ngalaba gọọmenti etiti na-ahụ maka mgbochi ọrịa n'ala anyị bụ Nigeria Centre for Disease Control(NCDC) na bekee ekwuola na Naijiria adịla njikere ịgbanahụ ịma n'ọnya Ebola dịka ndị Super eagles na-akwado izute mba Kongo n'asompi enyi na enyi.

Ọtụtụ ndị Naijiria na-atụ uche na o nwere ike ọrịa Ebola abata Naịjirịa ma ọ bụrụ na Naịjirịa na mba Kongo aga n'ihu mee asompi bọọlụ bọọlụ enyi na enyi ha na-akwadọ n'abalị 25 nke ọnwa Mee (echi).

Dịka WHO si kwuo, ka o si kwụrụ na mba Kongo n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Mee afọ 2018, mmadụ iri ise na asatọ enwela njirimara ọrịa Ebola, ọtaala isi mmadụ iri abụọ na asaa( 27), ebe mmadụ iri abụọ na asatọ (28) bụ ndị doro anya bu ọrịa ọjọọ ahụ.

O nweghị onye chọrọ ka ihe mere n'afọ 2014 oge Patrick Sawyer bubatara ajọ ọrịa na-efefe ma na-egbuli ọkara ndị nwetara ya bata ọzọ na Naịjirịa.

Ebola na-agbasakwa ka ọkụ ụgụrụ site na mmetụkọ ahụ maọbụ ọbara, mmiri si n'ahụ mmadụ maọbụ anụmanụ ọ na-arịa maọbụ akwa(clothes), akwa(beddings) ha dinara.

Agbanyeghị na Ebola bidoro n'ime obodo ebe a na-erikarị anụ agbatara na nta, ọ dị mfe ịgbasa n' obodo mepere emepe(cities) ebe e nwere ọtụtụ mmadụ nke butere ịtụ egwu.

Mana na nkọwa ya, onyeisi NCDC bụ Dọkịta Chikwe Iheakweazu kwuru na Naijiria ejikela ajị n'ume igbochi Ebola n'asompi ahụ.

O kwuru na NCDC na ndị isiọrụ ọdọụgbọelu, Mịnịstri etiti na-ahụ maka ahụike nakwa ndị isi otu na-ahụ maka bọọlụ bụ NFF ejikerela igbochie ọrịa ahụ isi na ndị ọbia ahụ bata Naijiria.

Iheakweazu kwuru,"Ọnọdụ ọbịbịa ha dị iche n'ụzọ pụrụ iche; Anyị ma ndị na-abịa, anyị ma ebe ha ga-anọ. A ga-enyocha tupu ha abata. Okwu ọbịbịa ha bụ obere okwu."

Image copyright NCDC
Nkenke aha onyonyo Dkta Chikwe Ihekweazu:

Ihekweazu kwukwara na e nwela atụmatụ nlebanye anya ga na-agụkọ ka ọrịa na- apụta na steeti ga ngwa ngwa ha nwetara ya, ebe ụlọọrụ nyochapụta ọrịa nke gọọmenti hiwere bụ National Reference Laboratory dị n' Abuja, a dịrịla njikere inyocha ọtụtụ ọrịa ndị metụtara ọha.

Otu dọkita bụ ọkachamara n'ihe gbara ahụike ọha (public health physician)Dkta Lanre Makinde kwuru na ọ buru n'ezie na ha enwela ezi nkwado, na Naijiria nwere ike igbochinwu ebola isi asompi a bata.

Mana ọ na-atụ uche na dịka anyị si eme na mbụ, Naijiria anaghị agba ọsọ mmiri ma o zughị ha ahụ.

Makinde si: "I cheta n'oge mbụ e nwere Ebola, gọọmenti gwara anyị na ha dị njikere, ma e mechaa Ebola bata.

"Ọ bụrụ na ọ bụghị okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụ ihe ga-ekwe omume ma Naijiria kwadoro ọfụma."

kụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a