Ọkaikpe enyela iwu ka a chọwa Innoson

Innocent Chukwuma Image copyright @InnosonMotors
Nkenke aha onyonyo Innocent Chukwuma

Otu ọkaikpe pụrụiche n'Ikeja dị na Legos bụ Mojisola Dada enyela iwu ka a chọwa onyeisi ụlọọrụ Innoson Nigeria Limited bụ Innocent Chukwuma.

Mkpebi a bụ maka na Maazị Chukwuma apụtaghị n'ụlọikpe ebe a na-ekpe ya ikpe ebubo ụfọdụ e boro ya.

Ọkaikpe ahụ mere mkpebi ahụ oge o kwetaghị ka e wetuo akwụkwọ ọkaiwu Chukwuma bụ George Uwechue dere ịnwale ikike ụlọikpe ahụ.

Mana onyeisi Innoson egosikwaghi n'ikpe a kpọrọ ya na mbụ n'ọnwa Jenuwarị 17, Feburuwarị 9, Maachị 14 na Epureel 25.

Nke a bụ nke ugbo ise Maazị Chukwuma na-egosibeghi onwe nye ụlọikpe ahụ.

Ndị EFCC kpụpụrụ Chukwuma n'ụlọikpe n'ebubo anọ gunyere iji aghụghọ nweta akụnaụba, izuohi na ime akwụkwọ n'ụzọ na-ezighiezi.

EFCC kwuru na Innoson site n'aghụghọ na ụzọ n'akwụghị ọtọ gbara izu ọjọọ jiri aghụghọ wee nara igbe ngwọ ahịa bu ngwọọrụ e ji arụ ọgba tum tum, na ihe ndị ọzọ e ji arụ ụgbọ nke ndị ụlọakụ Guaranty Trust site n'aka Mitsui OSK dị n'Apapa Legos.

Na mbụ, Innoson gọnarịrị ebubo ọbụla ma kwuo na ya na-ekpesa ikpe ahụ a na-ekpe kamgbe.

N'aka nkeọzọ, BBC Igbo gbalịrị inweta Innoson na ndị ọrụ ya ka ha tinye ọnụ n'okwu ọhụrụ a mana ha azaghị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: