Nọt Koria ka chọrọ nzukọ ha na Trump

Onyeisiala mba Amerika na ibe ya nke mba Nọt Korịa Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Trump na Jong-Un kwesịrị inwe nzukọ n'ụbọchị 12 nke ọnwa Juun

Mba Nọt Koria ekwuola na ha ka chọro ka ha na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nwee mkparịtaụka.

Onye kwuru ihe a bụ onye osote minista na-ahụ maka mmekọ mba ofesi na Nọt Koria bụ Kim Kye Gwan.

Maazi Kim kwuru na ndị be ha dị njikere ka ha na mba Amerịka hazie ihe ọbụla gbagwojuru anya etu ọbụla ha siri chọọ.

Cheta na Trump kagburu nzukọ ha na Kim Jong-Un bụ onyeisiala Nọt Koria kwesịrị ime n'ọnwa Juun ụnyaahụ.

"Anyị kwadoro mbọ Trump na-agba, bụ nke karịrị ihe ọbụla emere ịhụ na nzukọ a nwere isi," Kim kwuru n'ime akwụkwọ ụlọ mgbasaozi nke Nọt Koria zipụrụ n'abalị ụnyaahụ.

"Anyị na-agwa ndị Amerịka ọzọ na uche anyị dị n'ihazi nsogbu anyị na ha nwere etu ọbula ha jiri chọọ ya," Minista a kwuru.

Mana, n'Amerịka, nkagbu a Trump kagburu nzụkọ a na-ewe ụfọdụ ndị omeiwu iwe.

Chuck Shummer, bụ onyeisi ndi omeiwu si pati nke na-anọghị n'ọchịchị akpọrọ 'Democrats' na Bekee, ekwuola na Trump kwesịrị ịhụ na Nọt Koria kagburu nhazi ogbunigwe nuclear.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara