Toilet Snake: Ihe mbụ ị ga-eme ma agwọ tụọ gị iji zọ ndụ gị

agwọ cobra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Anwụchiela ụfọdụ ndị ụlọọrụ Jamb maka agwọ lolo ego

Kemgbe mmadụ nwụrụ mgbe agwọ tara n'ụlọ mposi, ụjọ jizi ndị mmadụ maka nke a.

Mana ị ma ihe ị ga-eme ma agwọ taa gị maọbụ etu ị ga-esi chụpụ agwọ n'akụkọ ebe i bi?

Ngwa gụrụ akụkọ a gawa n'ihu ka ị mata ihe ndị a.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na agwọ taa gị maọbụ taa mmadụ n'ihu gị?

Agwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Udi agwọ dị iche iche n'ụwa ruru puku 3,400

Agwọ bụ anụmanụ na-ebi n'ọhịa na-akpụ akụ.

Ụfọdụ agwọ anyị na-ahu na mpaghara Afịrịka bụ ;Eke, ajụala, echieteka na ndị ọzọ.

Ekwere agwọ arụ ya anaghị egbu mmadụ ma nwee nke na-egbu na-atufughị oge.

Ngalaba na-ahụ maka ahụike na mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) dere akwụkwọ ọhụrụ kọwara na n'otu afọ, ihe karịrị mmadụ nde 5.4 ka agwọ na-ata niile n'ụwa.

Lee nkọwa etu ị ga-esi ma agwọ nwere ike igbu mmadụ nakwa ihe niile i kwesiri ime ngwa ngwa ma ọ bụrụ na agwọ taa gị ma ọ bụ taa mmadụ n'ihu gị.

Ihe eji ama agwọ ọjọọ

Agwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Olulu di n'imi Agwọ ka ọ jị achọpụta anụ o ga-eri

  • Lee isi ya: Ọtụtụ agwọ ọjọọ nwere isi dika ihe nwere akụkụ atọ nke a kpọrọ 'triangle' na Bekee.
  • Lee agwa ya: Ụfọdụ ajọ agwọ nwere agwa na-acha ọfụma
  • Lee ma ị ga-ahụ olulu n'etiti anya na imi ya: Ọtụtụ agwọ ọjọọ nwere olulu bụ ihe ha ji aṅụta isi anụọhịa ha chọrọ igbu.
  • Anya agwọ: Ọ na-ara ahụ iji anya agwọ mara ma ọ bụ nke na-ata arụ na-egbu mmadụ ka ọ bụ nke nkịtị n'ihi na ọtụtụ agwọ ọjọọ na-achọ nri n'ụtụtụ nwere nwaanya (pupil) dị okirikiri.
  • Lee ebe ọ tara gị maọbụ onye ọ tara: Ọ bụrụ na eze ya dịkọta ọnụ, o gosiri na agwọ ahụ bụ nke ọjọọ.

Ihe niile I kwesiri ime

Agwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ọtụtụ agwọ ọjọọ na-acha nke ọma

  • Kpọọ ndị ụlọọgwụ maọbụ gawa ụlọọgwụ ngwa ngwa!
  • Lee agwọ ahụ anya ọfụma ọfụma: Ọ dị ezigbo mkpa ka ị kọwara ndị dọkịnta etu agwọ a siri dị.
  • Dinaa duu n'ala: Nke a ga-akwụsị mmịrị ọjọọ( venom) nke agwọ ahụ ịgbasa n'ime ahụ gị
  • Jiri akwa a kpọrọ 'bandage' na bekee kechie ọnụ ọnya ahụ.

Ihe niile ị kwesighị ime

Agwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Udi agwọ dị iche iche n'ụwa ruru puku 3,400

  • A mina ọnya ahụ ọnụ
  • Ejila mma bee ọnya ahụ
  • Ejila ụdọ kechie ọnya ahụ
  • Enyela onye agwọ tara mmanya ike ọbụla.
Akara ntụ-ntụ