Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Wilfred Ndidi ọgbakeela iso aga Rọshịa?

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

N'egwuregwu

Nkọwa foto,

Wilfred Ndidi bidoro ịgbara Super Eagles n'afọ 2015

Wilfred Ndidi bụ onye egwu etiti ndị Super eagles, ekwuola na ụjọ atụla ndị mmadụ maka mweronwe ya, ma kwuo na ọ dị njikere iso Naịjirịa gaa asọmpi iko mbaụwa na Rọshịa.

Cheta na Ndidi merụrụ ahụ n'asọmpi ndị otu ya bụ Leicester City na Crystal Palace gbara n'ọnwa Epreelụ.

Innoson asaala ndị ụlọikpe

Nkọwa foto,

Innocent Chukwuma

Onyeisi ụlọọrụ otu Innoson bụ Innocent Chukwuma asaala ndị ụlọikpe sị na ịkpọ ya onye a na-achọ achọ bụ ụzọ ha si achọ imebọ ya.

O kwuru na ụjọ anaghị atụ ya ịpụta ụlọikpe, kama na ha ga-akpụpụta ya n'ụzọ ziri ezi.

Cheta na ọkaikpe Mojisola Dada nyere iwu sị chọwa Innoson ụnyaahụ.

Na mba ofesi,

Nkọwa foto,

Ndị uweojii emechaala chọpụta na ọ bụ ogbunigwe ọbere gbapụrụ ebe ahụ

Ihe ruru mmadụ iri na ise merụrụ ahụ ka ọbere ogbunigwe gbara ebe ha nọ n'ụlọ nri na Canada.

Ndị uweojii obodo Mississauga bụ ebe ihe a mere, kwuru na ha ka na-eme nyocha ịma ndị gbapụrụ ya ebe ahụ.

A nwụchiri ndị Bịafra 32 n'Enugwu

Nkọwa foto,

Oteela ndị otu Ipob (Indigenous people of Biafra) ji bido ikwu maka 'restructuring'

Ọkaikpe S Okoro enyela iwu sị ka a ka nwụchie mmadụ iri atọ na abụọ bụ ndị na-akwado Biafra n'Enugwu.

A nwụchiri ndị a ka ha na-achọ ibido ngagharị maka ncheta 'ụbọchị Biafra' e mere n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa a.

Gee ya na nkeji nke ututu a:

Lee ihe nkiri taa

Ebuka Obi-Uchendu bụ onye na-eme ihe onyonyo amaama, gwara BBC Igbo ihe mere o jiri wuo ewu n'ụbọchị agbamakwụkwọ Harry na Meghan.

Akụkọ ga-amasị gị: