Nwoke metọrọ ụmụnne anọ sị na ọ bụ ekwensu

Fola Olowoigbo Image copyright Lagos Police Command
Nkenke aha onyonyo Okenye imetọ ụmụaka ụmụ nwanyị na-arị elu ugbua

Onye ọkaikpe, Zinnah Alikor nke ụlọikpe nta dị na Pọt Hakọt atụnyela otu nwoke gbara afọ 41 na nga maka ịmetọ ụmụnne anọ.

A na-ebo nwoke ahụ a kpọrọ Michael Isaiah ebubo iwakpo ụmụnne anọ dị afọ abụọ, asaa na iri na asaa.

Alikor, onye kwuru na ihe nwoke a mere bụ 'arụ ka arụ' kwuru n'okwu ahụ karịrị ụlọikpe ya ma nye mkpebi ka a tụnye nwoke ahụ na nga rue oge onyeisi ngalaba na-ekpe mmadụ ikpe (Director of Public Prosecution ) nyere ndụmọdụ n'okwu ahụ.

Mgbe a jụrụ ya, Isaiah sịrị na 'ọ bụ ekwensu nunyere' ya na ya ejighị anya ya.

N'otu aka ahụ, ndị uweojii na Legos na-enyocha otu agadi nwoke dị afọ 73 maka ebubo imetọ nwa dị 14 ma tunye ya ime.

Nwoke ahụ onye bụ ọkwọụgboala 'taizi' bị n'Agric, Ikorodu bụ agbataobi nne nwata ahụ ọ tụrụ ime.

Dịka ndị uweojii nọ na Legos siri kọwaa, agadị nwoke ahụ na-ezigakarị nwata ahụ ozi , nke nne nwa ahụ amaghị na ihe so ya.

Kọmishọna ndị uweojii bụ Imohime dọrọ nne na nna aka na ntị ka ha kpachapụ anya mara ndị ha na nwa ha na emekọrịta iji gbalahụ ụdị ihe a.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a