MASSOB: Ịchụgharị Innoson bụ atụmatụ ịchụpụ Ndịgbo n'ahịa

Ndị na-eme ngagharị iwe maka nwereonwe Biafra Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị na-eme ngagharị iwe maka nwereonwe Biafra

Otu so agba mbọ maka nnwereonwe Biafra bụ MASSOB ekwuola na nchụgharị a na-achụgharị onye nwe Innoson bụ Innocent Chukwuma bụ atụmatụ iji chụpụ Ndigbo n'ime ahịa.

N'akwụkwọ ozi nke onyeisi otu ahụ bụ Uche Madu wepụtara n'Ọka, isiobodo Anambara steeti, ha kwuru na nke a bụ ihe gosiri atụmatụ gọọmentị etiti ịhụ na Ndịigbo gba aka dịka o siri gbasara azumahịa.

N'ụbọchị Tọọsde, ụlọikpe nyere iwu ka achụwa Chukwuma.

Ha kwuru na ụdị agwa a na-akpaso Ndigbo bụ ụzọ were anya mkpa nnwereonwe Biafra dị.

"MASSOB na-ahụ ihe niile ndị ọrụ nchekwa na-eme Ndigbo dịka atụmatụ iji kpachie ọkpọaka ha dịka o siri gbasa akụnaụba. Anyị na-asị mba nye otu ndị ijide akụnaụba na mmepe obodo Naijiria na-enyeghi ndị Igbo ohere.

"Udi agwa a a na-akpaso Ndigbo bụ ojiegoachuego na ndị hiwere ụlọọrụ bụ agbaama na-egosi mkpa ọdị mbọ anị na-agba maka nwere onwe Biafra."

Otu a kwukwara na Ndigbo ekwenyeghị na mkpebi ụlọikpe sịrị ka a kpụta Innocent Chukwuma n'ihi na ọ bụ imejupụta ebumnaobi 'ndị iro' ọganihụ teknụzụ na-eme na Naijiria site na mmepụta ụgbọala ọ na-eme.

Massob boro ebubo na ọ bụ otu a ka e siri kpapụ Cletus Ibeto nke Ibeto group, ma na-achụghari Dr Ifeanyi Ubah nke Capital Oil.

Akụkọ ga-amasị gị: