Ntuliaka 2019: Ụmụnwaanyị omeiwu kwuru na ha chọrọ oche osote onyeisiala na 2019

Ụmụnwaanyị na Buhari Image copyright @Aso Rock/ Twitter
Nkenke aha onyonyo Ndị ụlọomeiwu kagburu akwụkwọ iwu gaara inye ụmụnwaanyị ohere pasentị 50 nyekwa ụmụnwoke pasentị 50

Ụmụnwaanyị omeiwu gara hụụ onyeisiala Muhammadu Buhari n'Asọ Rọk, Abuja ụbọchị Fraide ịrịọ ya ka o nye ụmụnwaanyị ọkwa osote onyeisiala n'afọ 2019.

Ụmụnwaanyị mere njem ahụ gunyere ụmụnwaanyị niile a họpụtara site na steeti 36 niile dị na Naịjirịa.

Onye kwuchitere ha ọnụ ha bụ Elizabeth Ativie kwuru na ụmụnwoke na-ekewapụ ụmụnwaanyị na Naịjiria.

Image copyright Aso Rock/ Twitter
Nkenke aha onyonyo Ohere a ne-enye ụmụnwaanyị ugbua bụ naanị pasentị 35

O kwuru na ọ bụ naanị otu mgbe ka ụlọomeiwu nke ukwu na nke nta nwere nwaanyị welitere isi n'ọkwa kemgbe ebidoro ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjiria n'afọ 1999.

O gwakwara onyeisiala na ihe ọbụla ọ gwara ha n'ọgbakọ ahụ "ga-abụ atụmatụ ga-emechaa bụrụ iwu."

Maka nke a, o kwuru na "oge ọbụla onyeisiala bụ nwoke, osote ya kwesiri ịbụ nwaanyị."

Nwaanyị Ativie kwukwara na n'ime nkewapụta atọ e ji anọchite anya na sineti, otu n'ime onye nnọchite anya kwesiri ịbụ nwaanyị ebe e nwekwara mmadụ itoolu ndị nnọchiteanya n'ụlọomeiwu nta, mmadụ isii kwesiri ịbụ ụmụnwoke ebe mmadụ atọ ga-abụ ụmụnwaanyị.

Na nzaghachi, onyeisiala Muhammadu Buhari jiri ọchị gwa ha "na osote onyeisiala anọghị ebe a mana ebumnuche na onye odeeakwụkwọ ga-agwa ya na a chọrọ ịnara ya ọrụ ya."

Mana o kelere ụmụnwaanyị ahụ maka nkwado ha na ụmụnwaanyị ndị ọzọ kwadoro ya ugbo anọ niile ọ zọrọ ọchịchị.

Maka ihe ha rịrọrọ ya, onyeisiala gwara ha na ya "adịghị ike etu ha chere" na onye nwereike ime ụdị ihe ahụ bụ onye na-achịụ n'oge ndị amị mana ya edosela akwa amị ya yiri "agbada".

Onyeisiala Buhari ga-azọ ọchịchị ọzọ dịka n'afọ 2019.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: