Popu Francis ahọpụtala bishọpụ ọhụrụ ga-akwado bịshọpụ Enugwu

Popu Francis Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Popu Francis

Onye nlekọta ụlọụka Katọlik n'ụwa niile bụ Ọkachasị nsọ Popu Francis ahọpụtala Ụkọchukwu Fada Ernest Obodo dịka bishọpụ ga-akwado dayọsis ụka katọlik n'Enugwu.

Nhọpụta a dị n'akwụkwọ Vatican depụtara taa.

Tupu nhọpụta a, Obodo bụbu onyeis ụlọ nke Saint Bernard Senior Seminary ebe ụmụakwụkwọ na-ebi ma bụrụkwa onye nkuzi n'ụlọakwụkwọ Bigarad Memorial Seminary dị n'Enugwu.

Popu họpụtakwara ya dịka onye nlekọta Mediana.

A mụrụ ya ụbọchị 24 ọna Oktoba afọ 1966 n'Awha-Imezi n'Enugwu.

Ọ bara ụlọakwụkwọ seminarị nke nta "Sacred Heart' ebe ọ gụrụ Filosofy na Tiọlọji n'ụlọakwụkwọ seminari ukwuu nke Bigard dị n'Enugwu.

E chiri ya ụkọchukwu ụbọchị 22 ọnwa Julai afọ 2002 na dayọsis Enugwu ma kamgbe e chiri ya echichi ahụ, o jidela ọtụtụ ọkwa na dayọsis ahụ.

Ọkwa ndị o jirila gụnyere ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka "Queen of Hoky Rosary" bido afọ 2000 rue afọ 2001, ụkọchukwu nke "saint Charles" n'Amechi Idodo bido n'afọ 2001 rue afọ 2004 nakwa onye mgbazi n'ụlọ ebe ụmụakwụkwọ na-ebi na "Saint Bernard's Seminary", Nchatancha.

Ọ bụkwa odeakwụkwọ ndị ụkọchukwu na dayọsis Enugwu nakwa onye nlekọta otu Saint Juudu na onye otu kọmishọna ndekọ na dayosis ahụ bido afọ 2004 rue afọ 2009.

Bido afọ 2010 rue afọ 2016, ọ gụrụ akwụkwọ ọkachamara na mahadum Innsbruck dị n'Ọstria.

Kamgbe afọ 2016, ọ na-rụ dịka onyeisi ụlọakwụkwọ "Saint Bernard Senior Seminary Hostel" nakwa onye nkuzi n'otu ụlọakwụkwọ ahụ n'Enugwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara