Gọọmentị etiti enyeachịbeghị Ezinaụlọ Ekwueme ego ụlọọgwụ - Ukọchụchwụ Chukwuma

Dr Alex Ekwuemme
Nkenke aha onyonyo Ekwueme ruru Naịjirịa ọrụ dịka onye osote onyeisiala Shehu Shagari, ma bukwara onye so hiwa otu pati PDP

Gọọmentị Naịjirịa na ezinaụlọ onye bubu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Alex Ekwueme nọ na ndọrọndọrọ maka ego akwụrụ ụlọọgwu dị na mba Briten letara ya anya tupu ọ nwụọ.

Onye kwụru nkea bụ Ụkọchukwu Emmanuel Chukwuma bụ onye ndụ uka Anglican nke Enugwu, bukwuru onye ncasịobi ezinaụlọ Ekwueme, ụlọ ntaakụkọ nke akpọrọ SUN kwuru.

Nlekọta Ekwueme, dị ka iwu Naịjirịa siri kwuo, kwesiri ị dị naka Naịjirịa, mana agbanyeghi na gọọmentị kwụrụ ụgwọ ụlọọgwụ ya na mba Briten, ụlogwụ ahụ weghachịri ya bụ ego makanana ezinaụlọ Ekwueme akwụọla ya.

Ọ bụ ego ahụ ka Ụkọchukwu Chukwuma na ekwu na orutebeghị n'aka ndị nwe Ekwueme.

Ya bụ egọ bụ puku Pọn narị abụọ.

Nkenke aha onyonyo Ụkọcchukwu Chukwuma kara ụkọ́ mgbe eniri Ekwueme

Ọnwa isii agaala kemgbe Ekwueme nwụrụ n'ụlọọgwọ na London, n'afọ 85. E niri ya n'be ya Oko nke di n'Anambara steeti.

Ndị aka ha dị na Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha chọrọ ịkwụghachị ego a etu o si kwesi mana ọ bụ n'ego Naịjirịa bụ naira ka ha ga-eji, mana ndị ezinaụlọ Ekwueme si na ha chọrọ ka akwụọ ya na ego ndị Briten bụ pọn, nke bu ihe ha nyere ndị ụlọọgwụ.

Nchọpụta ndị gọọmentị tinyere anya na ya bụ ihe na-egosi na ha bụ ego ndị ụlọọgwụ weghachịtere dị na ụlọakụ Naịjirịa.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a