Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Iwu Sharia kpatara ogbugbu ndị mmadụ - CAN
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Ogbugbu ndị mmadụ bụ maka gbasa iwu sharia - CAN
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi otu jikọtara ụka kraịst na Naịjirịa bụ Samson Ayokunle ekwuola na ogbugbu ndị mmadụ na Naịjirịa bụ i ji gbasa iwu sharia n'obodo niile dịka Onyeisi Boko Haram bụ Abubakar Shekau kwuru
Ayokunle kwuru na Abubakar Shekau akpụghị mmiri n'ọnụ mgbe o kwuru ebumnobi gbasara nke a.
Ụlọikpe amaala ndị mmadụ ikpe na Kameruun
Ụlọikpe dị na Kameruun amala mmmadụ asa bụ ndị si mpaghara mba ahụ na-asụ Bekee ikpe maka nnupuisi na iyi ndụ egwu
Ndị a gụnyere onye ndu ha bụ Mancho Bibixy bụ ndị ga-anọ mkpọrọ site afọ iri rue afọ iri na ise.
Akụkọ mba ofesi
Ebe foto si, Getty Images
Olileanya ka dị na nzuko Donald Trump na Kim Jong-un ga-emecha dị ire, dịka Trump kwuru na mba abụọ ndị na-enwe mkparịta na-amịị mkpụrụ.
Nke a bịara n'ime abalị abụọ ọkagburuchara nzukọ a na mberede.
N'egwuregwu;
Ebe foto si, Getty Images
Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'ụwa bụ FIFA enyela otu bọọlụ mba ụwa niile aha ejiri mara n'asọmpi iko mba ụwa
Ha kpọrọ ha 'Nku na-ebu Ugwu Afrịka' bụ Wings of African Pride n'olu bekee.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
Ihe mere m jiri wuo n'ụbọchị agbamakwụkwọ Harry na Meghan.