Buhari: Ka anyị lụọ ọgụ megide mwakpo ụmụaka

Ụmụaka Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Naịjirịa na-echeta ụmụaka ha niile n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Mee

Onyeisiala Mohammadu Buhari wepụtara ozi iji cheta ụbọchị ụmụaka na Naịjirịa bụ nke o kwuru ka-akwụsị mwakpo ụmụaka.

N'ozi ya, Buhari kpọkuru ndị ọrụ nchekwa, ezinaụlọ, ndị isi obodo, ndị isi okpukperechi, na ndị ọrụ bekee ka ha kee ajụ n'ume iji chekwa ugwu ruru ụmụaka.

Ọ gwara ndị ọrụ nchekwa ka ha gbali sie ike chekwa ụmụaka site n'ihe mmerụahụ ọbụla dịka e dere ya n'iwu Naịjirịa.

O kwuru na otu ihe kachasị mkpa nke ọchịchị kwere na nkwa bụ i nye ụmụaka agụmaakwụkwọ tara ọchịchị.

O kwuru na ọchịchị ya agbaala mbọ ịhụ na-enyere ụmụakwụkwọ nrị kwa ụbụchị dịka ha kwere na nkwa.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụakwụkwọ na-efe ọkọlọtọ Naịjirịa n'obi ụtọ

Buhari kwuru na ụmụaka bụ ọdịnihu Naịjirịa, na-atụmatụ si n'aka ha na-enye ya owuweanya na Naịjirịa nwere ndịnihu dị mma.

N'ikpeazụ Buhari gwara ndị isi ụlọakwụkwọ dị icheiche ka ha gba mbọ chekwa ụmụakwụkwọ etinyere n'aka ha.

N'otu aka ahụ,lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ncheta ụbọchị ụmụaka taa n'akara twitter:

Onyeisi senate bụ Bukola Saraki kwuru na oge mmemme ncheta ụmụaka nke arọ 2018 kwesiri ị bụ mgbe onye ọbụla ga-eme ihe niile dimma iji chekwa ụmụaka.

Ebe onye bụ bụ osote onyeisiala akpọrọ Atiku Abubakar ayọla ka onye ọbụla wepụta ohere ṅụọ ụmụaka Naịjirịa ma mee kwa ka ọchị hara ipụ ha n'ihụ.

Isiokwu Ndị Emetụtara